Nigeria 2019 Elections: Etu 'Zoning' si emetụta ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa

Obasanjo Image copyright Getty Images

Anyị ga-amalite site n'iza ajụjụ gbasara ihe "Zoning" pụtara.

Gịnị bụ "Zoning"?

"Zoning" bụ ụzọ iwu wepụtara e ji eke ala iji hụ na ahaziri ala ndị ahụ n'ogbe n'ogbe na-enweghị mgbagwọjụ anya ọbụla.

Nke a bụ nkọwa "Zoning" dịka akwụkwọ nkọwapụta Britannica si depụta.

Na ndọrọndọrọ ọchịchị, nkọwa a na-egosi mmasị ndị nọ n'ọchịchị nwere iwulite obodo. Nke a pụtara ihe na mba dịka Briten nakwa Amerịka.

Mana ọ pụtachabeghị ihe na mba ka na-etolite etolite dịka Naịjirịa.

Njirimara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nwere ọtụtụ tigbuo na zọgbuo mana nsogbu kachasị bụ nkewa ndọrọndọrọ ọchịchị na-ebute dị n'etiti ndị si na mpaghara ọwụwa-anyanwụ na ọdịda-anyanwụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDay 24: Ị ga-atụnyere onye ụkọchukwu gị sị gị tụnyere na ntuliaka?

Nsogbu a emetụtala achụmta vootu na Naịjirịa nke mere ka ụfọdụ ogbe hụ onwe ha dịka ndị akpachapụrụ akpachapụrụ.

Ọ bụrụ na inyonye anya n'akụkọ gboo gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa , ị ga-ahụ na tupu ndị agha anara ọchịchị n'ike, ndị ọnụ na-eru n'okwu kọwara Naijirịa dịka ngalaba atọ jịkọtara ọnụ akpọrọ

mpaghara ugwu , ọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ . Mpaghara ọ bụla nwere onye na-anọchite anya ha na gọọmenti etiti .

Mana mgbe agha akpọrọ Civil war dachara, ụfọdụ ndị si mpaghara ndị a na-ahụta onwe dịka ndị a megbu emegbu.

Kedụ mgbe "Zoning" bidoro ?

Naịjirịa laghachiri n'ọchịchị ọhakarasi n'ọnwa May nke afọ 1999 ka afọ iri na isii ọchịchị ndị agha gafechara.

Nke a mere ka ndị ọchịchị hazigharịa etu a ga-esi mee ka ọchịchị rute ogbe niile maka udo na njịkọ.

Kedụ onye malitere" Zoning" ?

Ọ bụ pati PDP kpebiri ịhazị atụmaatụ iji wee jikọta ụmụ Naịjirịa nọ gasị na mpaghara di iche iche.

A na-ahụta Zoning dịka ike ikike ọchịchị onyeisiala n'etiti mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

Nke a mere ka PDP were atụmaatụ a wee kee ọchịchị n'etiti ndị si n'ugwu nakwa ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ọ bụ okwu Zoning a mere ka pati PDP hazie ndị kwe na ndị ekweghị gbasara ogbe ga-ewepụta onye ga-achị obodo Naịjiria.

Image copyright Getty Images

Mgbe ọchịchị ọhakarasi bidochara na Naịjirịa, Abdusalami Abubakar bụ onye na-ekpe ụka Alakụba sikwa mpaghara ugwu nyefere Olusegun Obasanjo na-ekpe ụka Christ sikwa mpaghara ọdịda anyanwụ

Naịjirịa ọchịchị.

Ka Obasanjo chichara n'ọkwa ahụ ugboro abụọ, ọ bụ atụmaatụ Zoning mere ka pati PDP họrọ ọnye si na na mpaghara ugwu họpụta onyeisiala Umar Musa Yar'Adua bụkwa onye Alakụba.

Umar mechara nwụọ, Goodluck Jonathan bụ osote ya chịtọpụrụ n'ọnọdụ ya mana mgbe ọ chọrọ ịpụta ị zọ ọkwa nke ugboro abụọ, ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ugwu jụwara isi.

Dịka ntụliaka 2019 na-abịa, Zoning egosikwala ihu ya ọzọ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Image copyright DONALD DUKE /TWITTER
Nkenke aha onyonyo Duke si PDP pụọ maka Zoning

Ọ bụ eziokwu na ya bụ "Zoning" eguzosiela ike na Naịjirịa mana ụfọdụ ndị mmadụ achọghị ya.

Onye chịbụrụ Cross River steeti bụ Donald Duke kwuru na o si na PDP gaa pati ọzọ ịzọ oche onyeisiala makana PDP keneyere ndị ugwu ikike ahụ.

O kwukwara na ya bụ atụmatụ adịghị mma makana o na-amụta ndị ọchịchị ọjọọ nye Naịjirịa

Kedụ ka "Zoning" si metụta ntuliaka 2019?

Pati abụọ kachasị ewu bụ PDP na APC họpụtara ndị si na mpaghara ugwu dịka ndị ga-azọrọ ha oche onyeisiala.

Ndị APC họpụtara onyeisala Muhammadu Buhari ebe pati PDP họpụtara Atiku Abubakar .

Ọnọdụ a ga-eme ka onye ọ bụla meriri n'etiti ha abụọ si na mpaghara ugwu chịa ruo afọ anọ.

Nke a ga-eme ka ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ na-atụ anya oche ọchịchị n'afọ 2023.

Ma atụmatụ a, ọ dị mma ma ọdịghị mma bụ ndọrọndọrọ nọrọ onwe ya.

Ka ihe si kwuru ugbua, ọ dịka atụmatụ a dị ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ahụ mma.

Akụko ndị ga-amasị gị: