Nnamdi Kanu: Anyị enwebeghi okwu maka njem Nnamdi Kanu - Lai Mohammed

Nnamdi Kanu Image copyright @MaziNnamdiKanu

Foto dị iche iche na-apụta na soshal midia na-arụtụ aka na Nnamdi Kanu ahapụla mba Izrel gawa mba ya nke abụọ bụ Briten.

Kepukepu mbụ kwuru na Maazị Kanu nọ na Briten pụtara na Facebook ubọchị 25 nke ọnwa Jenụwarị.

Ka ndị mmadụ ka na-ajụ ma akụkọ a ọ bụ eziokwu, akara Twitter bu aha Maazi Kanu dere na ọ nọzị mba Briten, ma wepụtakwa otu n'ime foto abụọ na-agagharị na soshal midia.

Nke a ga-abụ mbụ Kanu na-alaghachị mba Briten kemgbe ndị agha Naịjirịa wakporo be ya n'afọ 2017 n'ime emume ha kpọrọ "Egwu Eke".

N'ime mgbagwoju anya ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ so ahụghị ya n'anya, Maazị Kanu pụtara ihe na mba Izrel n'ọnwa Oktoba nke afọ 2018.

BBC Igbo jụrụ Minista na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala bụ Lai Mohammed, ihe gọọmentị Naịjirịa nwere ikwu maka njem Kanu, mana o kwuru na ya amaghị maka njem ahụ.

Ọ si, "Ejighi m ihe dị na soshal midia arụ ọrụ. Ọ bụrụ na onwere ihe mere dị mkpa anyị kwesịrị itinye ọnụ na ya, anyị ga-etinye ọnụ. Ka o si la dị, onweghi ihe m nwereike ikwu maka okwu a ugbua."

Lai Mohammed kwukwara ka BBC kpọghachị ya ma e mecha makana ọ nọ n'ime nzukọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu ka bụ onyeisi IPOB- Emmanuel Kanu

BBC gbakwara mbo ịnụta n'ọnụ otu n'ime ndị Ipob na London mana onweghi onye zara ekwentị ya.

Ka o si la dị, Nnamdi Kanu bụ nwaafọ Briten, nke mere na o nwere ohere ịga mba ahụ mgbe ọ chọrọ.

Okwu ebubo mmegide obodo bụ nke Naịjirịa na-ebo ya, na mba Briten, Kanu abụghị onye a na-ahụ ka onye megidere iwu ọbụla.

N'otu aka ahụ, Ipob abụghị otu iwu machiri na Briten, dịka ọ bụ na Naịjirịa ugbua.