Nigerian 2019 Election: Nyocha na nchopụta nke bụ eziokwu n'ihe ndị ndọrọndọrọ na-ekwu

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwekarị nkwa ma ha na-zọ ọchịchị, lee nchọpụta BBC mere maka ihe ha na-ekwu.

Lee ụfọdụ ihe ha kwuru na nchọpụta BBC mere banyere ya.

Ihe a bụ agba nke abụọ n'ime usoro BBC ji achọ ijide ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'ọgọdọ ha

Ihe ndị na-azọ ọchịchị kwuru ga-eso n'ihe ndị ga-eme ntuliaka n'ụbọchi 16 nke ọnwa Febụwarị ga-eji họpụta onye ha ga-atụrụ vootu.

Atụmatu nyocha na nchọpụta a bụ nke ehibere iji tụzịe mgbasa ozi metụtara ntuliaka ka osi okwu ndọrọndọrọ ọchịchị gawa ihe metụtara agamnihu obodo.

Mana, kedu etu ha ga-eji mara na ihe ndị na-azọ ọchịchị na-ekwu bu eziokwu?

Ka anyị chọpụta.

Atiku Abubakar
Ihe nwereike ruo mmadụ nde 57 na Naịjirịa enweghị mmiri ọnụnụ ka nde 130 bi ebe rụrụ ụnyị enweghị ezigbote ụlọ mposi na ihe ndi ọzọ metụtara ịdị ọcha.
... (Akwụkwọ ebumnuche PDP)
Nvọpụta eziokwu

Okwu Atiku kwụ ọtọ. N'afọ 2015, ngalaba World Health Organisation (WHO) gbara ama na mmadụ nde 57 na Naịjirịa enweghi ohere inweta mmiri ọṅụṅụ di ọcha maọbu ụlọ mposi.

Nke pụtara na ihe ruru mbe atọ n'ime anọ ndị Naịjirịa enweghi ụlọ mposi, ebe otu n'ime atọ nwere ụlọ mposi na-esoghi n'ihe a na-eme.

Ọrịa afọ ọsịsa nke e nwere ike igbochi site n'ime ka onye ọbụla nwee ụzọ ọ ga-esi enweta mmiri ọṅụṅụ dị ọcha nakwa ụlọ mposi dị ọcha, so n'ihe kacha egbu ụmụaka na Naịjirịa.

N'afọ 2017, WHO kwuru na ụmụaka na-erughi afọ ise dị ihe karịrị puku 74, nwụrụ site n'ọrịa afọ ọsịsa.

N'afọ 2018, mịnịstrị nke gọọmentị etiti na-ahụ maka ahụịke mere nyocha ụfọdụ ezinaụlọ iji mara omume ha gbasara ahụike ha.

Ha chọpụtara na ọkara okwu gbasara ọrịa afọ ọsịsa n'ụmụaka na-erubeghi afọ ise kacha dị ire na mpaghara Ugwu-Ọdịdaanyanwụ; ọkachasị na Sokoto na Kebi steeti.

Ndị mmadụ kacha biri na mpaghara ndị mepere emepe, nke na-eme ka ihe ruru otu n'ime mmadụ atọ na-eke ụlọmposi ma mee ka ihe ize ndụ nwere ike isi n'ibute nje ghara ịra ahụ.

Otu ọnọdụ ahụ n'ime obodo kacha njọ. Mgbe Naịjirịa wepụtara atụmatụ ọ kpọrọ PEWASH n'afọ 2016, inweta mmiri ọṅụṅụ dị ọcha n'ime obodo kwụ na pasentị 57, ịdị ọcha kwụ na pasentị 29, nke na-erughidi nkezi ole mba a ruru n'afọ 2015.

N'ọnwa Nọvemba 2018, Onyeisiala Muhammadu Buhari mara ọkwa gbata gbata na mpaghara WASH ma hibe ihe ọ kpọrọ National Action Plan for Revitalisation of Water Supply, Sanitation and Hygiene (WASH) n'ụlọọrụ State House Conference Centre.

Otu n'ime atụmatụ imepụta ihe a hụrụ anya a kpọrọ Sustainable Development Goals (SDGs) na Bekee nke ngalaba United Nations tụpụtara, bụ ịgba mbọ hụ na mmadụ niile nwere ohere inweta mmiri dị ọcha nakwa ọnọdụ dị ọcha ga-enyere aka igbochi ọrịa ndịa mgbe ọ na-erula afọ 2030.

Muhammadu Buhari
Inweta mmiri pọọmpụ nke nọbu na pasentị 32 n'afọ 1990, agbadaruola na pasentị asaa na 2015; inweta ọnọdụ dị ọcha sikwa na pasentị 38 ọ nọbu n'afọ 1990 daruo pasentị 29 na 2015. Mba anyị nọzị n'ọkwa nke abụọ n'ụwa na ndị na-anyụ nsị n'ezi makana ihe ruru pasentị 25 na-anyụ nsị n'ezi.
Nvọpụta eziokwu

Nke a bụtụ eziokwu. Buhari kwutere ya na Naịjirịa bụ abụọ n'ụwa na ndị kacha nwee ndị na-anyụ nsị n'ezi, nke pụtara na ha enweghị ụlọ mposi n'ụdị ọbụla. Naanị mba India karịrị Naịjirịa na nke a.

Ndị Naịjirịa karịrị nde 46 na-anyụ nsị n'ezi site n'ihe World Development Indicators nke ngalaba World Bank kwuru. Nke a erughi otu ụzọ n'ime ụzọ anọ na ndị mejuputara mba a.

Mana a bịa na mpaghara, ọnụọgụgụ ahụ dị iche. Steeti atọ kacha nwee ndị na-aga mposi n'ezi bụ Kogi, Platu na Benue, ebe ihe ọkara ndị mmadụ bi ebe ahụ anaghị aga n'ụlọ mposi. Nke a si na nchọpụta ndị WHO na Unicef mere n'afọ 2016/2017.

N'aka ọzọ, ihe na-erughi pasentị ise ndị bi na Bọrọnu, Zamfara, Kano, Abịa nakwa Legọs steeti, na-aga mposi n'ezi.

Taa, njuputa ndị na-aga mposi n'ezi n'ime obodo ji ụkwụ abụọ karịa ndị na-eme ya n'obodo mepere emepe, mana ihe ịga mposi n'ezi na-emetụta na-aka njọ n'obodo ndị mmadụ juru eju, nke mere ka obodo ndị dị ka Legọs bụrụ ebe na-enye ndị mmadụ nchegbu.

Ọtụtụ nje dị iche iche gụnyere afọ ọsịsa nwere ike igbu mmadụ, nwere ike imalite ma gbasaa site n'ife na nri na mmiri dị n'ogige ebe na-adịghị ọcha, awụfughị atịtị n'ụzọ ziri ezi nakwa elekọtaghị ahụike mmadụ nke ọma - dịka ejighi ncha na mmiri kwọọ aka.

Buhari kwuru na ndị Naịjirịa inweta ọnọdụ ịdị ọcha gbadara ọfụma, nke gụnyere ụlọ mposi dị iche iche nakwa ụzọ e si enweta mmiri dị ọcha iji esi nri nakwa maka ọṅụṅụ, na-enweghi nsogbu obụla.

Ihe ndekọ si n'otu nchọpụta ndị WHO na Unicef mere na 2015 kwuru na ọnọdụ a gbadara n'eziokwu, mana ọnụọgụgụ ya dịtụ iche n'ihe Buhari kwuru.

N'afọ 1990, WHO kwuru na ihe ruru mmadụ pasentị 38 na-enweta ọnọdụ ịdị ọcha, mana ọ bụ naanị pasentị 25 na-enweta ya n'afọ 2015.

Ọtụtụ afọ ọgbaghara metụtara ọtụtụ n'ime akụrụngwa ndị meburu ka a na-enweta mmiri dị ọcha nakwa ụlọ mposi, ọkachasị na mpaghara ndị nọ n'Ugwu-ọwụwaanyanwụ.

Taa, ọtụtụ ndị Naịjirịa enweela usoro inweta mmiri ọṅụṅụ dị mma, mana ọ bụghị mmiri pọmpụ na-agba n'ime ụlọ ndị mmadụ; nke bụ nke a na-ahụta dịka ọrụ kacha mma.

Na gburugburu Naịjirịa niile, naanị n'ime FCT ka ihe karịrị otu n'ime mmadụ iri na-enweta mmiri pọmpụ na-agba n'ime ụlọ ha.

A bịa na ndị kacha, naanị otu n'ime mmadụ atọ na-esi na borehole maọbụ nke a kpọrọ tubewell enweta mmiri ọṅụṅụ,nke bụkwa usoro e si enweta mmiri dị ọcha.

A bịa n'ugwu awụsa, ụlọ abụọ n'ime ise ka nọ n'enweghi usoro e si enweta mmiri dị ọcha.

Kingsley Moghalu
Ngalaba ahụike Naịjirịa anaghị enweta ụdịrị ego o kwesịrị, site n'etu gọọmentị etiti si etinye ya ihe na-erughi pasentị ise e dere na bọjetị maka ya n'ime afọ iri gara aga. Maka nke a, enwebeghi mgbe Naịjirịa ji mezuo Abuja Declaration (2001) bụ nkwa ha na mba Afrịka ndị ọzọ kwere na ha ga-etinye opekatampe ọ bụrụ pasentị 15 ego bọjetị kwa afọ na nlekọta ahụike.
... (Ngosiputa uche onye na-azọ ọkwa onyeisiala YPP)
Nvọpụta eziokwu

Nke a bụ eziokwu. N'ime afọ iri gara aga, nkezi ego ole gọọmentị etiti na-etinye n'ahụike na-abụ pasentị 4.8 nke mkpokọta bọjetị kwa afọ.

Ego akachasị tinye n'ahụike na Naịjirịa bụ naanị pasentị isii nke gọọmentị etiti wepụtara n'afọ 2012, mana n'afọ 2018 na bọjetị a na-atụ anya maka nke 2019, ego e kewapụtara maka ya bụ naanị pasentị anọ.

Nke a pụtara na gọọmentị na-akwụ naanị naịra puku na narị itoolu (N1900) nke pụtara naanị dọla ise, n'isi otu onye.

Naịjirịa so n'ime mba iri ise na abụọ kwere nkwa ibugo ego ole ha na-etinye n'ahụike ruo pasentị 15 n'afọ 2001. Ruo ugbua, naanị mba Tanzanịa na-emezu ya bụ nkwa.

Tupu Naịjirịa e nwee ike imezu nkwa a, ọ kwesịrị inweta ihe karịrị ụzọ atọ n'ime ego a na-ekewapụta maka ahụike, mee ka o ruo tarịị naịra na nde atọ (N1.3t) n'afọ 2019.

Nke ahụ ga-ebuli ego ole ha na-etinye n'isi otu onye Naijirịa maka ahụike ruo puku naịra asaa, nke bụ dọla 19.

Mana a bịa kpọmkwem, iwelitekwu aka na bọjetị etu a nwere ike inye gọọmentị ohere itinyekwu aka n'akụkụ ahụike ebe ndị na-agaghị ara ahụ ilebanye anya, ma bụrụkwa ebe ga-emetụta ọtụtụ ndị mmadụ.

Iji maa atụ, ihe na-erughi ọkara ụmụaka niile nọ na Naịjirịa na-enweta ọgwụ mgbochi iji gbochie ọrịa ndị nwere ike inye ha nsogbu na ndụ ha n'ọdịniihu.

Otu gọọmentị họpụtara maka ime nyocha na 2016 gbakọrọ na ihe ọ ga-ewe inye otu nwatakịrị ọgwụ mgbochi niile kwesịrị ya pụtara naanị puku naịra iri na atọ.

Ọ ga-ewe ijeri naịra iri itoolu (N90b) inye ụmụaka niile a mụrụ ọhụrụ na Naịjirịa ọgwụ mgbochi, mana nke a agụnyeghi ụgwọ a ga-akwụ ndị ọrụ ahụike ga-enye aka ikesa ọgwụ ahụ nakwa ego njem ha ji aga ụlọọgwụ wdgz.

Ndị na-enye ego na-efu na-emezukarị ego e ji azụta ọgwụ mgbochi.

Omoyele Sowore
Ego ndị mmadụ na-esi n'akpa nke ha na-akwụ ruru pasentị 74 ego Naịjirịa na-akwụ maka ahụike. Ụfọdụ oge ọ na-etinye ụfọdụ ezinaụlọ n'ụbịam.
... (Ngosiputa uche onye na-azọ ọkwa onyeisiala AAC)
Nvọpụta eziokwu

Nke a bụ eziokwu kpọmkwem. Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-akwụ nnukwu ụgwọ e ji agwọ ha ọrịa n'ụlọọgwụ tupu a malite inye ha ọgwụgwọ. N'elu dọla ole ọbụla a na-emefu maka nlekọta ahụike, sentị 72 n'ime ya na-esi n'ime akpa onye na-arịa ọrịa, ebe ihe na-efu n'akpa gọọmentị na-abụ naanị sentị 17.

Naịjirịa nọ n'ọkwa abụọ ndị kachasị n'Afrịka maka pasentị ego ole ndị mba a na-eji aka ha akwụ ụgwọ nlekọta ahụike; ndị ka ha bụ mba Komorọs. Ọ nọ n'ọkwa asatọ na mba niile nọ na gburugbruru mbaụwa.

Atụmatụ gọọmentị wepụtara a kpọrọ National Health Insurance Scheme (NHIS), bụ ihe kwesịrị ikpuchite nnukwu oke ụgwọ nlekọta ahụike ndị Naịjirịa n'eziokwu, nwere naanị obere ndị denyerela aha ha, mana ịchọpụta mmadụ ole debanyerela aha ha na-ara ahụ ịchọpụta.

Onye na-arụ ọrụ dịka Onyeisi odeakwụkwọ otu NHIS ekwuola na ọ dị ka ndị denyerela aha ha n'atụmatụ a erughi pasentị ise.

Dịka ndekọ ndị World Bank dekọrọ site n'afọ 2009, ndị Naịjirịa ruru pasentị 3.7 gbadara n'okpuru akara ụbịam maka nnukwu ụgwọ ha na-akwụ maka nlekọta ahụike.

Makana na ịkwụ ụgwọ maka nlekọta ahụike ka dakwasịrị onye na-arịa ọrịa, ụfọdụ ezinaụlọ ego ha na-akpata anaghị agafekarị otu dọla na sentị 90 ($1.90) kwa ụbọchị anaghị akwụnwu ụgwọ a.

Mana ka o sila dị, enwebeghi ndekọ ọbụla enwerela gbasara okwu a na Naịjirịa kemgbe 2009.

Fela Durotoye
Onye ọbụla gaferela afọ iri isii (60) ga na-enweta nlekọta ahụike n'efu. Onye ọbụla na-erubeghi afọ ise ga-enwetakwa nlekọta ahụike n'efu. Ụmụnwaanyị dị ime ga-esokwa nweta.
... Ụbọchị 19 nke Jenụwarị 2019 (Nrụrịtaụka ọkwa onyeisiala)
Nvọpụta eziokwu

Ọ ga-ewe gọomentị ihe dị n'etiti $8,815,338,100.00 na $26,446,014,300.00 inye ndị gaferela afọ iri isii, ụmụaka na-erubeghi afọ ise nakwa ụmụnwanyị dị ime, nlekọta ahụike n'efu n'ime otu afọ.

N'afọ 2015, ngalaba UN kwuru na ihe ruru nde asatọ (8,108,000) n 'ime ndị Naịjirịa gafere afọ iri isii.

Ihe ọ na-ewe iji lekọta otu onye gaferela afọ iri isii kwa afọ ruru puku dọla abụọ na narị asatọ na iri ise na abụọ ($2,852), dịka ngalaba Organisation for Economic Co-operation and Development (OECD) si kwuo.

Inye ndị niile gaferela afọ iri isii nlekọta ahụike n'efu na Naịjirịa ga-eri gọọmentị $1,759,436,000.00 kwa afọ.

Maka ndị na-erubeghi afọ ise, ndị nke UN kwuru na ha ruru nde iri atọ na otu (31,109,000) n'afọ 2015, ọ ga-eri gọọmentị $6,750,653,000.00 kwa afọ iji lekọta ahụike ha n'efu. Ọ ga-erikwa ha $305,249,100.00 iji lekọta ahụike ụmụnwanyị nde asaa (7,445,100) dị ime n'ime otu afọ.

Ugbua, mkpokọta ego ole gọọmentị na-ewepụta maka ịnata ọgwụgwọ n'efu bụ $81, 640,000,00, mana ọ bụ naanị ihe na-erughị pasentị ise n'ime ndị Naịjirịa na-anata ọgwụgwọ n'efu.

Mmekọrịta Pia maọbụ metụ ka ị mekọrịta

Nvọpụta eziokwu

Anyị na-agba mbo iwepụta nkọwa okwu si n'ọnụ ndị ndọrọndọrọ n'usoro ga-enyere eziokwu ohere ịchị, site na-iji ihe Bekee kpọrọ "data" ga-eru mmadụ niile aka.

Anyị ga-etinye uche na ihe dịrị ime obodo di iche iche mkpa, dịka ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche si kwuputa ha.