Onnoghen: Senate akagbuola nzukọ ha ka NBA malitere abụbụ ọrụ

ndị ọkaiwu
Nkenke aha onyonyo SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria

Otu jikọrọ ndị ọkaiwu na Naijiria bụ NBA na aha ịchafụ agwala ndị otu ha ka ha jụ ịga ụlọikpe site n'ụbọchị Tuzde nakwa Wenezde, bụ echi na nwanne echi.

Nke a bụ otu n'ime nkwekọrịta ndị otu a mere na nzukọ ha mere taa n'Abụja.

Otu a katọkwara mwepụ ọchịchị etiti wepụrụ nnukwu ọkaikpe Naijiria bụ Walter Onnoghen n'ụzọ iwu akwadoghị.

Ha wepụtakwara otu kọmiti mmadụ atọ mejupụtara bụ ndị gụnyere Olanipekun, A.B Mahmood nakwa onyeisi ha bụ Paul Usoro, iji leba anya n'okwu a.

Na nke a na-eme, ndi ọkaiwu Naịjirịa ekwuola na ha agaghị alaghachi ọrụ eche maka okwu Onnoghen a dịka ha sibu kwuo.

Atumatu ọhụrụ a si n'oche onyeisi ụlọ omeiwu bụ Bukola Saraki sị na ha ga-alaghachi ọrụ ụbọchị 19 nke ọnwa Febụwarị, bụ mgbe emechara ntuliaka nke 2019.

Akụkọ ga-amasị gị: