Onye tọọrọ onyeisioche pati APC nke ndị Abia steeti?

Nwoke ejichiri Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Atọọrọ Nwamkpa na mgbede ụbọchị onyeisiala gara Abia maka achụm nta vootu.

Ndị uweojii nọ n'Abịa ekwuola na ndị ntọ atọrọla onyeisioche pati APC bụ Donatus Nwamkpa na steeti ahụ.

Ha kwuru na ọ bụ sọ ọkwọ ụgbọala Nwamkpa gbalarịrị ndị ntọ ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti Abịa bụ Geoffrey Ogbonna gwara BBC Igbo na a tọrọ Nwamkpa n'elekere itoolu nke mgbede ụbochị Jenụwarị iri abụọ na itoolu.

Ogbonna kwuru na a tọọrọ Nwamkpa n'ụzọ korota Aba dị n'Isialangwa.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, na ya na ndị otu ya ka na-eme nyocha ka ha mara ebe ha tọọrọ Nwamkpa gaa ka ha nweeike gbapụta ya.

Cheta na onyeisiala Muhammadu Buhari gara achụmnta vootu na steeti Abia ụnyaahụ bụ Tuzde.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: