Referendum Ipob: Peter Obi chọrọ ịbụ osote onyeisiala, Ipob chọrọ Biafra - Paul Achalla

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Paul Achalla banyere referendum

Nke na-afịọ ugbua bụ na Ipob, bụ otu na-achọ ka ekewapụta mba ọhụrụ a kpọrọ Biafra na Naịjirịa, chọro ka ewere ụbọchị 16 nke ọnwa Febụwarị mee atụmatụ Bekee kpọrọ, "Referendum".

Ọtụtụ mmadu na-ajụ ihe nke a pụtara makana Ipob sịbụ na ọ bu "nọdụ n'ụlọ" ka ha chọrọ ka ndị otu ha mee n'ụbọchị ahụ.

BBC Igbo tunyere otu n'ime ọkaiwu Ipob bụ Paul Achalla ajụjụ n'ọnụ ka ọ gwa ọha nke bụ eziokwu.

Maazi Achalla gwara BBC na nke bu eziokwu bụ na ihe Ipob chọrọ bụ ka ụwa maka na o nwere ndị achọghi ntuliaka a Naịjirịa na-eme site ịnọdụ n'ụlọ ụbọchị ntuiliaka ahụ.

Achalla sị, "Ndị si mba ofesi bịa ịhụ etu ntuliaka aka ahụ ji aga ga-ahu na ndị be anyi ajụgo Naịjirịa, jụ ihe niile dị ya n'ime."

Ọ gakwara n'ihu kwuo na "referendum" ha ga-eme ka onye pụtara ka onyeisiala ghara inwe ikike Bekee kpọrọ, "Legitimacy".

Banyere okwu Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru maka atụmatụ referendum ahụ, Paul sị na okwu ya adabachaghị makana aghụghọ dị na 'restructuring' ahu ọ na-ekwu okwu ya.

Gee ya ntị n'olu:

Maazi Achala gakwara n'ihu kọwa ihe mere ha ji na-esi ọnwụ maka nwere onwe na atụmatụ "referendum" a.

Ọ sị na onweighi isi ị si ka esoruru Naịjirịa dịka Nnia Nwodo kwuru makana ekwesiri ime ka ndị mmadu mara ebe uche ndị mmadụ dị ugbu a, nakwa ịnapụ gọọmenti ikike ọha kwuo ha ji arụ ọrụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPaul Achalla maka ịtụ vootu

Maka Peter Obi bụ nwaafọ Igbo na-azọ ọkwa na pati sepụtara isi bụ PDP, Achalla sị na ihe Ipob na-achọ karịrị Peter Obi, ma kwukwa na ndị ndọrọndọrọ n'ọwụwa anyanwụ nwere ihe jikọrọ ha na Naịjirịa.

Lee ihe Nnia Nwodo kwuru maka atụmatụ referendum ahụ:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEtu referadum ga-esi dịnwu ire- Ohaneze

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a