Victor Moses enyeela goolu mbu ya na Turkey

Akụkọ dị mkpa

Victor enwerela ọkụ bịa

Image copyright Getty Images

Nwaafọ Naịjirịa na-agba bọọlụ na mba ofesi bụ Victor Moses jị ọkpụ goolu gwa ndị Turkey na ya abịara.

Moses si Chelsea gawa otu bọọlụ Fenerbache nyere goolu ya n'ime nkeji iri ọ batara ọgbo egwuregwu.

Ihe mere taa

Image copyright LAOLU AKANDE

Osote Onyseisiala Naịjirịọ bụ Ọkammụta YemiOsibanjo jiri nwapem gbalahu onwu taa dịka ụgbọelụ helịkọpta bu ya ta dara n'ike n'ogbọ egwuregwu dị na Kabba Kogi steeti.

Osinbajo ezipụla ozi na ahụ dị ya mma site n'akara Twitter ya na-ekwa kwa na o kwenyere na Chinke ga-echekwa ha n'oge a.

Atiku Abubakra bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP ezigarala Osinbajo ozi itiakanobi site n'akara Twitter ya.

Ndị Igbo kwanyere Ekueme ugwu

Igwe obodo Oko dị na Anambra steeti ekelela ndị mmadụ pụtara ị kwanyere nwanne ya Alex Ekwueme ugwu dịka a na-eme emume ncheta olili ya taa n'Oko.

Obi na-achị ọnịcha nakwa Mazi Solo nọchitere anya aka na-achị steeti ahụ bụ Willie Obiano gụnyere na ndị nnukwu mmadu bịara ya bụ emume.

Na mba ofesi

Ndị na-akwado onye kpọrọ onqw ya onyeisiala mba Venezuela bụ Juan Guaido ebidola ngagharịwe taa dịka ụfọdụ mba ndị Yurop na-akwanye Nicholas Maduro ọkụ n'ike ka ọ mee ntuliaka ọhụrụ.

Akụkọ BBC na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ọgbaghara ọ daala n'Ohaneze?

Akụkọ na-eru BBC ntị bụ na nkwado Ohaneze Ndịgbo nyere onye na-azọ ọchịchị n'okpuru patị PDP bu Atiku Abubakar ebutela ogbaghara n'etiti ya bu ọtụ.

Ka ọkwụ ugbua, Uche Okwukwu bụ ode akwụkwọ Ohaneze na-akọwa na enyerela onyeisi Ohaneze bu Nnia Nwodo ezumike. Mana Uche Okpaga bụ bụ ode akwukwọ mgbasa ozi si na ọbụ Okwukwu ka enyere ya bụ ezumike.

Mwakpo Boko Haram

Image copyright Magnum Photos

Ndị Boko Haram gburu ihe ruru mmadụ iri isi n'obodo Rann di na Borno steeti ụbọchị Monde nke isu a.

Nke bịara n'azụ ndị agha Naịjirịa hapụrụ ha bụ obodo ka Boko Haram wakpochara ya.

Eborogọvanọ Virginia oke agbụrụ

Image copyright Getty Images

Aka na-achị steeti Virginia dị na mba AmerỊka bụ Ralph Northam na-arịọ mgbaghara maka foto otinyere n'akwụkwọ mgbe ọ nọ ụlọakwụkwọ n'afọ 1984.

Foto ndị na-ewe ụtụtụ mmadu iwe makana ha sị na ọ na-akwado oke agbụrụ emela ka ọtụtụ sị ka Northam rituo n'ọkwa dịka GỌVANỌ

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Ọ ga-akpọtụ na Legọs taa n'emume ọsọ akpọrọ Lagos City Marathon na Bekee.

A na-eme Lagos City Marathon kwa afọ.

Nke a bụ afọ anọ ya.

Gee akụkọ ndị a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdị Awụsa bi Ebonye pụtara ịkwado Atiku

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a