Walter Onnoghen agbaala arụkwaghịm

Walter Onnogehn Image copyright National Judicial Council

Kepukepu anyị na-anụ bụ na ọkaikpe ukwu nke Naịjirịa bụ Walter Onnoghen agbala arụkwaghịm n'ọrụ ya dịka ọkaikpe.

Ụlọọrụ ntaakụkọ AFP dere nke a na onye ọkaiwu Onnoghen bụ Adegboyega Awomolo gwara ha na Onnoghen agbala arụkwaghịm.

Mana ọ kọwaghị n'uju ihe mere o ji mee nke a.

N'okwu ya "N'ezie ọ gbaala arụkwaghịm" Ọkaiwu Awomolo gwara AFP.

Nke a na-abịa n'ime otu ụbọchị otu jikọtara ndị ọkaikpe bụ NJC n'ịchafụ tụnyere Onnoghen alọ ka ọ gbaa arụkwaghịm n'ime nyocha ha mere.

Cheta na e boro Onnoghen ebubo ekwuputaghị akụnaụba ya tupu ọ baa ọchịchị bụ nke ọ ka na-azara ọnụ ya n'ụlọikpe code of conduct.

Ndị mmadụ na-ekwu maka ya.

Ma n'ajụjụ ọnụ a gbara Femi Adesina, bụ onye ndụmọdụ onyeisiala n'okwu gbasara mgbasaozi, o kwuru na ọmaghị ma onyeisiala Muhammadu Buhari e nwetala ozi Onnoghen dika ọnọ na mba Jọdan ugbu a.

Ọ kọwara na ya gụrụ ozi ahụ n'igwe mgbasaozi dịka ndị mmadụ ọzọ, gbakwụnye na e nwebeghị ihe gosiri na otu NJC enwetakwuela ozi ahụ.

Ọ bụ n'ụbọchị Monde nke ọnwa Febụwarị ka ụlọịkpe na-ahụ ihe gbasara omume kwụọtọ dọtịrị ikpe Walter Onnoghen.

Onyeisioche CCT bụ Danladi Umar nyere iwu ka Onnoghen n'onwe ya pụta bịa zara ọnụ ya tupu ikpe ya agaa ihu.

Onnoghen bụ onye onyeisiala Naijria chụrụ n'ọrụ dịka eboro ya ebubo ịzo akụnaụba ya.

Etinyere kwara onye ga-anọchi anya ya bụ Ibrahim Tanko Mohammed.

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a