Abdel Fattah Al-Sisi nke Egypt abụrụla onyeisioche African Union

Akụkọ dị mkpa taa:

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Ijipt bụ Abdel Fattah Al-Sisi, ga-amalite ọchịchị dịka onyeisioche otu African Union site taa gawa n'ihu.

Image copyright Getty Images

Ọchịchị ya ga-ebido n'ọgbakọ nke iri atọ na abụọ nke a na-eme n'isi obodo Ethiopia bụ Addis Ababa.

Mkparịtaụka BBC Igbo na Nnamdi Kanu:

Ụmụ Igbo unu adịla njikere maka mkparịtaụka ga-adị n'etiti onye ndu ndị otu Ipob bụ Nnamdi Kanu na BBC Igbo n'ụbọchị Mọnday na-abịa?

Ọ ga-akpọtụ n'elekere atọ nke ehihie, ị nwekwara ohere ịjụ ya ajụjụ ndị na-anụ gị ọkụ n'obi.

Njem Buhari na Legọs:

Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị Igbo na-akwado Onyeisiala Buhari pụtakwara n'ọgbọ

Ụgbọ achụmnta vootu Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị otu pati APC bịarutere ọgbọegwuregwu Teslim Balogun dị na Legọs n'ụbọchị Satọọde a.

Lee etu o si gaa ebe a :Etu ndị mmadụ si nabata Onyeisiala Buhari na Lagos

Buhari zutekwara ndị ojiegoachụ ego na njem ahụ, ebe ọ nọ gwa ha na akụnaụba obodo amalitela ito ọzọ makwuo na ọ ga na-aga n'ihu na-etolite.

Ndị akụ na-atakasị dịka Aliko Dangote na Femi Otedola so nọrọ na nzukọ a.

N'egwuregwu,

Man Utd ji nkata kponye Fulham goolu atọ ka ha zutere na Premier League n'ụbọchị itoolu nke Febụwarị 2019.

Mmeri ahụ emeela ka ha rigoruo n'ọkwa anọ n'elu tebulu ahụ.

APC sị na ha ka na-akwado Ayogu Eze

Image copyright Ayogu Eze/George Ogara/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ndọrọ onye ga-eji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Enugu Steeti dị n'etiti Ayogu na Ogara.

Party APC ekwuola na agbanyeghị mkpebi Ụlọikpe Ukwu nyere banyere onye ga-eburu ha ọkọlọtọ n'Enuwgu, ha kwụọ Ayogu Eze na-azụ.

N'ozi Edegbe Odemwingie bụ osote onye na-ahụ maka mgbasa ozi na APC zitere BBC, ha sị na ha nwere ncheckwube na ụlọ ikpe mkpegharị ga enye ha arịrịọ ha riọrọ ma mee Maazi Eze onye ga-azọ ọchịchi n'okpuru APC n'Enugwu.

APC gakwara n'ihu sị na ha na-etinye anya n'okwu onye ga-azọrọ ha ọchịchị na Rivas steeti, bu ebe Ụlọ Ikpe ukwuu nyere ikpe atughi ha ọchị.

N'ofesi,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ

Mba Amerịka na-akwado ka onyeisiala ha bụ Donald Trump na nke mba Nọt Koria bu Kim Jong-un nwee nzukọ ọzọ.

Trump na Kim ga-ezute na ụbọchị iri abuọ na asaa nke ọnwa Febụwarị na obodo Hanoi di na mba Vietnam.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Flying Eagles nke Naịjirịa ji ọkpụ goolu otu asataghị merịe mba Nije mgbe ha zutere ụnyaahụ n'asọmpị akpọrọ Under 20 African Cup of Nations.

Mmerị a nyere Naịjirịa ohere itozu ịga agba nke abụọ n'asọmpị a. Nke pụtara na ha ga-eso sọọ mpị na Iko Under 20 a ga-agba na mba Polond n'ọnwa Mee.

BBC Igbo na Nnamdi Kanu ga-eme mkparịtaụka,

Ka ọ kwụ ugbua, BBC Igbo na Nnamdi Kanu bụ onyeisi Ipob ga-enwe mkparịtaụka n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2019, bụ Mọnde.

Mkparịtaụka a ga-eme ga-abịara unu dịka Facebook Live n'elekere atọ nke ehihe na Naịjirịa, nakwa elekere abụọ na London.

Gee nkeji a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri anyị taa bụ:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMike Ejeagha: Aghara m ihe egwu m gbaa ọsọ Agha