Nigerian elections 2019: Naijirịa omeriela Boko Haram?

Foto Atiku Abubakar n'aka ekpe, Muhammadu Buhari n'aka nri

Ndị omekataraihepụọụjọ bụ Boko Haram na-akpa mkpamkpa na mpaghara Ugwu-ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa kemgbe afọ iri.

Onyeisiala Buhari na-ekwu na mkpamkpa ha ebelatala kemgbe ọ banyere n'ọchịchi n'afọ 2015.

Ndị na-azọsa ya ọkwa ekweghi na nke a, ma na-ekwu na ọnọdụ ebe ahụ agbarụọla ma site n'etu ndị a si atọrị mmadụ na etu ha si awakpo obodo.

Ka Naịjirịa na-akwado ntuliaka n'ubọchị 16 nke Febụwarị, BBC Reality Check na-enyocha asị na asị banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Gini bụ Boko Haram?

E hibere otu a n'afọ 2002, dịka otu anaghị enye nsogbu chọrọ ka ahazigharịa ofufe Alakụba n'ugwu Naịjirịa, mana ha bidoro jiri aka ike sowe njem ha.

Mkpamkpa Boko Haram abụghị sọsọ na Naịjirịa ka ọ na-eme. Ha na-akpa ike na Cameroon, Chad na Nijey.

Egbuola ndị nkịtị puku kwụrụ puku na nsogbu a mekwara ka ihe karịrị mmadụ nde abụọ gbaa ọsọndụ n'ime afọ iri a mkpamkpa a na-akpa.

Itọrọ umụakwụkwọ so n'ime njirimara Boko Haram, bụkwa nke dọtara anya ndị mba ofesi n'afọ 2014, ka a tọrọla ụmụakwụkwọ ruru narị atọ n'ulọakwụkwọ dị n'obodo Chibok na Borno steeti, bụ steeti ha kachasi akpa ike.

N'afọ 2015, Boko Haram ritere ọkwa ka ndị omekome kachasị enye nsogbu n'ụwa bụ ugo ngalaba akpọrọ "Institute for Economics and Peace" na Bekee nyere ha.

Kemgbe ahụ, ala Boko Haram ji agbadaala. Ha kewakwara n'ụzọ n'ụzọ.

Mana, Boko Haram ka na-enyekwa nsogbu ebe ahụ, n'agbanyeghi ihe niile gọọmentị kwuru na ha na-eme ka a gbanyụọ ọkụ ha.

Igosipụta ọnọdu a, n'afọ 2018, ha tọọrọ ihe karịrị umụakwụkwọ narị n'obodo Dapchi. Emechara tọghapụ ha, ma ka jide otu ruo ugbua.

Asị na asị so ya

Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo, na-akwado onye na-azọ ọchịchị n'okpuru pati na-anọghi n'ọchịchị bụ PDP bụ Atiku Abubakar, ji ike katọọ Onyeisiala Muhammadu Buhari maka etu o si ebuso Boko Haram agha.

Obasanjo sị; "Ọnọdụ nchekwa obodo na Naịjirịa adịla njọ, a na-atọrọ mmadu ebe niile."

Mana etu Onyeisiala Buhari ji ahụ ihe nbanyere ncheckwa dị ezigbote iche. Ọ sị na ememinaala Boko Haram n'obi ha na Borno steeti kemgbe afọ 2015.

Kedụ nke bụ eziokwu banyere mwakpo na ntọrọ mmadụ?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ihe karịrị mmadụ nde abụọ bụ ndị bere ka ugo na-enweghị ebe obibi maka mwakpo Boko Haram, dịka ngakaba UNHCR si kwuo

Mwakpo Boko Haram obelatala?

Nchekwa adịghị na nsogbu inweta ozi n'ime obodo na-eme ka ọ raa ahụ inweta akụkọ maka ihe na-eme, nke mere na ọtụtụ adịghị apụta ihe.

Ngalaba gọomentị bụ "National Bureau of Statistics" na-enye ohere ka ọha nweta ozi maka nchekwa na ihe ndị ọzọ n'ime Naịjirịa, manaotu onye na-ekwuchitere ha gwara BBC na ha anaghị achịkọta ozi maka mkpamkpa Boko Haram.

Mana nyocha ndị "Armed Conflict Location & Event Data Project (ACLED)" mere, na-etinye anya n'ozi ndị ụlọọrụ mgbasaozi ndị dị na Naịjirịa na ndị ọzọ na-agbasa.

Site na iru ihe karịrị puku ise nwụrụ na 2015, ọnwụ ole Boko Haram butere agbadala ruo otu puku kwa afọ n'ime afọ atọ garala aga.

Mgbada a sitere na mbusoagha gọọmentị Naịjirịa si n'aka ndịagha buso Boko Haram n'afọ 2015, nakwa nkwado ndị mba ofesi nyere ha.

A napụtachara ọtụtụ ebe ndị buru ibu Boko Haram jibu agbachara ọnụ, n'oge ebusoro agha a.

Ihe ndị ọzọ banyere ntuliaka Naịjirịa:

Ya mere, Onyeisiala Buhari atụghị asị ka o kwuru na mkpamkpa ndị Boko Haram agbadaala ọfụma kemgbe ọ banyere ọchịchị n'afọ 2015.

Mana mwakpo ndị a akwụsịbeghị kpamkpam, makana enweela ọtụtụ mwakpo na mbido 2019 a.

"A bịa n'ihe banyere ọnọdụ a, eche m na ọnọdụ a nọ ugbua dị njọ ma chekwa na erubeghidị nso imeri ha ma ncha," ihe a ka Alex Thurston, onye ọkammụta na-akuzi "political science and comparative religion" na mahadum Miami dị n'Ohio kwuru.

Kedụkwanụ maka ntọrị?

Enwere ihe a kpọrọ "Nigeria Security Tracker", nke otu "Council of Foreign Relations (CFR)", dị na Washington, na-eji etinye anya n'ihe gbasara ntọrị ndị mmadụ site n'ozi pụtara n'ụlọọrụ mgbasaozi ndị dị na Naịjirịa.

Nke a na-egosi ogogo ntọrị ndị mmadụ rigoro n'afọ 2014 na 2015, oge Boko Haram ka na-akpa ezigbote ike.

Mana, n'agbanyeghi ọdịda ntọrị n'afọ 2016, ọ rigokwaala ọzọ kemgbe ahụ, ebe e kwuru na a tọrọla mmadụ 310 n'afọ 2018.

Otu echiche ndị mmadụ na-ekwuputa maka ọrịrị ntọrị a bụ na Boko Haram enweghịzị obodo ha ji aka nakwa ikike ndị agha ha, makana ha anaghịzị atụ ndịagha aka ọgụ n'ihu.

Kama ya, ndị agha nnupụịsi a atụgharịala na-awakpozi ụlọakwụkwọ nakwa ime obodo, ebe ha si atọrọ ndị mmadụ.

Ya mere, mgbe Obasanjo kwuru sị "ọnọdụ nchekwa akala njọ ebe a na-atọrị ndị mmadụ aghara aghara", ọ tụghị asị makana ntọrị ndị mmadụ na-agbago karịa mbụ; nke anaghị echefu ọsịsọ dịka ntọrị ụmụakwụkwọ narị na Dapchi na 2018, bụ ihe na-ebute oke echiche.

Ụjọ a ka njọ maka etu Boko Haram na-esi eji ụmụaka eme ndị na-eji ogbunigwe egbu onwe ha. N'afọ 2017 na 2018, e nwere ọnụọgụgụ ugboro 77 nakwa 26 bụ mgbe ha ji ụmụaka kpaa mkpamkpa a. Unicef kwuru na ha ji ụmụaka itoolu n'afọ 2016,

Ọ bụ ebe niile ka a na-atọrị mmadụ?

Ile anya etu e si atọrị mmadụ na gburugburu Naịjirịa niile, otu abụghị n'ezi, makana Boko Haram na-akpa ike n'Ugwu-Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

A na-ekwuputakwa okwu ntọrị na mpaghara Naịja-Delta - mana nke a abụghị akaọrụ Boko Haram.

Ya bụ na i lee anya na ntọrị niile na-eme na-abụghị naanị ndị Boko Haram, ị ga-ahụ na ọ bụ naanị na mpaghara ka ọ na-eme karịa "ebe niile" dịka Obasanjo si kwuo.

N'ozuzuoke, ọ dị ka ike Boko Haram agbadawala na mpaghara Ugwu-ọwụwa anyanwụ.

Mana ihe so ya n'azụ bụ nrigo ntọrị ndị mmadụ, n'agbanyeghị na odoghi anya ma nke a o na-egosi na otu a akpawala ike ọzọ kaọbụ na ha na-achụzị ndị enweghi ike ịzọ onwe ha n'aka ha.

Gụọ akụkọ ndị ọzọ si Reality Check

Zitere anyị ajụjụ gị

Soro anyị na Twitter