Nigeria Election 2019: Ọkụ agbaala ụlọ ntuliaka na Plateau steeti

ọkụ ọgbụgba Image copyright INEC

Otu ụlọ ebe a na-akwado ime ntuliaka alaala n'ọkụ gbara ya taa.

Dịka akụkọ siri kwuo, ọkụ ahụ repịara ihe niile dị n'ime ụlọ ahụ gụnyere akpati akwụkwọ vootu nakwa akwụkwọ vootu dị icheiche.

Onye ọnụ na-eru n'okwu kwuru na ihe a awụnyela aja na nkwado ntuliaka mana o rubeghi ịme nyocha gbasara ịrụka ntuliaka na abịa.

Maka Leah Sharibu:

Nne Leah Sharibu bụ otu nwa agbọghọ ka tọrọ n'aka ndị Boko Haram ka ha wakpochara obodo Dapchi n'afo gara aga, ezigarala gọọmentị ozi ka ha mezuo nkwa ha kwere ịnapụtara ya nwa ya.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abụja na nwa ya ka nọ n'aka ndị oji isi aghọ mgbọ a makana o kweghị esonye ha n'ofufe ha.

N'akụkọ si mba ofesi,

Ngalaba United Nations kwuru sị na otu ụgbọelu helịkọpta nke ndị agha mba Itiopịa kpọkasịrị n'ogige ụlọọrụ UN nke dị Na mpaghara Abyei dị n'etiti mba Sudan nakwa Saụt Sudan.

Ihe mberede ụgbọelu ahụ gburu mmadụ atọ, mana o dobeghi anya ihe mere o ji kpọkasịa.

N'egwuregwu,

Otu Tottenham zuru ike n'ahụ ndị Leicester City ka ha ji ọkpụ atọ a satara otu merie ha mgbe ha zutere na Premier League.

N'aka ọzọ, ndị na-akwado ndị Chelsea nakwa Man City, chị aka n'obi na-eche ihe ha ga-agbata ma e gbuzuo bọọlụ taa.

Ndị agha na ndị Biafra:

Image copyright Getty Images/@HQNigerianarmy

Ndị agha Naịjirịa nke Division 82 n'akpagharị n'Abia steeti agọọla ebubo na ha gbara egbe ma gbuo otu onye na steeti ahụ.

Ha gọnarịrị na onweghị onye otu ha, ha dunyere ka o sogharịwa onye chiburu Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu.

Mana ha kwetara na ha nwụchịrị ndị otu Ipob isii ghara ha nye n'aka ndị uweojii nọ na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Musa Sagir kwuru na ọ bụ maka iweta udo na iwezuga ọdachi ka ha ji wuchie mgbe ndị otu Ipob na-eme ngagharịwe.

N'akụkọ ọzọ,

Nkenke aha onyonyo E mere ọkammụta Mahmood Yakubu onyeisi Inec n'ọnwa ọktoba afọ 2015

Ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ntuliaka na Naịjirịa akpọrọ Inec n'ịchafụ ekwuola na ọ ga-ajụ aha ndị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị na-emeghị ihe ndị iwu kwadoro dịka a na-atụ anya n'aka ndị nnọchiteanya

pati di iche iche tupu amalite ntuliaka.

A wakporo ụfọdụ ndị nkwado PDP n'Abuja

Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala n'okpuru PDP kwuputara nke a site n'akara Twitter ya.

Ọ rịọkwara mmadụ niile ha gbalahụ nsogbu na ọgbaghara n'oge a.

N'ofesi,

Nkenke aha onyonyo Ihe mberede a achụpụla mmadụ ruru puku atọ na be ha

Ebupula mmadụ puku kwuru puku na mba New Zealand dịka ndị ọrụ mmeyụ ọkụ na-agba mbọ ịhụ na oke ọkụ bidoro n'ụfọdụ obodo na mba ahụ kwụsịrị kpam kpam.

Oke ọkụ a malitere kamgbe abalị isii na-akwado ibanye obodo ọzọ dị n'akụkụ ya.

Etinyela ọnọdụ gbata gbata, ebe mmadụ ruru puku atọ agbapụla na be ha maka ihe mberede a.

Ọkụ a bụ ọkachasị kamgbe afọ 1955.

N'Egwuregwu

Image copyright Getty Images

Otu Egwuregwu bọọlụ Mancity na Chelsea ga-akwata ya na mgbede taa bụ Febụwarị iri n'asọmpị Premier league.

Soro anyị na bbc.com/Igbo ka ị chọpụta onye ike ga-agwụ makana anyị ga-agwa ụnụ ka o si gaa.

Nkeji taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤmụ Igbo agaghị aza oku ịhapụ ime ntuliaka Ipob kpọrọ- Ohaneze