Nigeria Election 2019: I nwere ike iji mkpịsịaka obụla masịrị gị tụọ vootu - INEC

Mkpịsịaka e nwere ike iji tụọ vootu
Nkenke aha onyonyo Mkpịsịaka e nwere ike iji tụọ vootu

Dịka ụbọchị ntụliaka afọ 2019 na-eru nso, ụlọọrụ INEC e kwupụtala na onye ọbụla tozuru oke ime ntụliaka nwereike iji mkpịsịaka masịrị ya were tụọ vootu .

Onyeisi ngalaba ụlọọrụ INEC na-ahụ maka nkụzi na ntụziaka nye ọhanaeze bụ Ijeọma Igbokwe, na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere kọwara,

na ọbụghị iwu na e nwere mkpịsịaka e wepụtara maka iji tụọ vootu.

O kwuru na mkpịsịaka ọbụla ga-eme ka ọnyeahụ nweta ihe achọrọ na ntụliaka bụ nke a ga-anabata n'oge atụm vootu.

Ijeọma Igbokwe kwukwara na ihe mere eji wepụta atụmatụ a bụ i ji nyere ndị na-enweghị mkpịsịaka zuru ezu aka iji sonye na ntụliaka a na-abịa.

Image copyright INEC NIGERIA/FACEBOOK
Nkenke aha onyonyo PVC ndị anatabeghị

Ọ gwakwara ndị ga-eme ntụliaka ka ha gbalịa hụ na ha bịanyere aka n'ohere e mebere maka nke a iji gbanahụ ịkagbu vootu ha.

Na ntụnye ya gbasara nnwakpo ndị a na-eme megide ụlọọrụ INEC na-ebe dị iche iche, o kwuru na ụlọọrụ INEC e nyeela mkpesa gbasara nke a n'aka ndị uweojii.

O kwukwara na ha na-arụkọ ọrụ ọnụ iji kwụsị ajọ ọnọdụ a.

Akụkọ ga-amasị gị: