Nigeria Election 2019: Ndịagha elu ebidola ikesa ngwaọrụ ntuliaka

Ndị ọrụ NAF

Ndịagha elu bụ NAF n'aha ịchafụ amalitela ịkesa ngwaọrụ ntuliaka maka ntuliaka na-abịa ụbọchị Feb 16.

Ngwaọrụ ndị a gụnyere ndị a ga-ebute n'abalị nakwa ndị a ga-ebute n'ehihie bụ ndị a ga-ebunye Inec.

E bidoro ibu ibu ndị ahụ site n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe nke dị n'Abuja rue ọdọ ụgbọelu ndịọzọ dị na gburugburu Naịjirịa.

Image copyright Getty Images

Ndịagha elu pụrụiche bụ ndị "C-130H" ga-ebunye ndịọrụ INEC, ndị ọrụ ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ CBN nakwa ndịọrụ nchekwa dị icheiche ngwaọrụ a.

Cheta na mgbe onyeisi ndịagha elu bụ Sadique Abubakar na ndị osote ya nwere nzụkọ, o kwuru na ha dị njikere inyere Inec aka n'ibugharị ngwaọrụ ntuliaka dịka ha siri mee n'oge gara aga.

Ọ dị mkpa ịmata na ụgbọelu njem ndị a NAF nyere Inec bụ iji kwado ọrụ INEC dịka akwụkwọ iwu siri kwuo.