Man United vs PSG: Ike 'ekwensu ọbara ọbara' dara, ike PSG eguzoro

Ndị Manchester United Image copyright Getty Images

Otu PSG tiri Man Utd mmọnwụ, iji gosi ha na ha abịaghị igwu egwu, ka ha ji goolu abụọ merie ha na Old Trafford.

Nke a bụ mmeri mbụ a na-emeri otu egwu bọọlụ Man Utd kemgbe Ole Gunna Solskjaer malitere ịchịkọta ha.

Presnel Kimpembe ji ha gbachara ọnụ ma gbaa aka ahịa, n'ihe bụ goolu mbụ ọ na-enyere ndị PSG.

Kylian Mbappe dọkara neetị David De Gea n'ọkara nke abụọ, ebe e mechara chụpụ Paul Pogba ka o nwetara akwụkwọ edo edo abụọ.

Angel Di Maria gbabuuru Man Utd bọọlụ eleghi anya n'azụ ka ọ na-agwọ ha ara n'agbanyeghi emu ha nọ na-akwa ya; o bunyere Kimpembe bọọlụ o ji nye goolu.

Anthony Martial na Jesse Lingard merụrụ ahụ n'ọkara mbụ, mere ka ewepụ ha.

Ajụjụ onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ "isi Man Utd a ga-apụtakwa mgbe ha ga-aga na Parc des Princes n'ụbọchị isii nke ọnwa Maachị?"

Ihe mberede okporoụzọ mere n'Imo steeti:Ụgbọala Tipa dakwasịrị ma kurie otu ụgbọala Pasat bụ nke otu pati APC ji achụ nta vootu n'Owere bụ isi obodo Imo steeti.

Image copyright Modestus Nwamkpa

Ihe mberede a mere n'okporoụzọ akpọrọ Jacob Zuma bụkwa nke e ji "akanchawa" wee mara.Anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Igbo na ihe mberede a mere ka obere ụgbọala a e ji achụ nta vootu nke Muhammadu Buhari nakwa Rochas Okorocha, chọrọ igbafe ụgbọala Tipa ahụ.O kwuru na onweghi onye nwụrụ, mana e burula onye ọkwọụgbọala ahụ gawa n'ụlọọgwụ makana ọ merụrụ nnukwute ahụ.

Nnamdi Kanu na BBC:

Na mkparịtaụka Nnamdi Kanu na BBC Igbo nwere, o kwuru na ihe ọ gabigara n'aka ndị agha mere o ji zoo mgbe ahụ o zoro.

O bokwara ndị na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ ebubo na ha chọrọ igbu ya n'afọ gara aga, so mee o ji gbaa ọsọ, gaa lekọta onwe ya n'ahụ ọ merụrụ.

Gere ihe ndị ọzọ o kwuru ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu na BBC Igbo

Udo ga-achị n'Imo steeti:

Ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti ebinyela aka n'akwụkwọ udo, ebe ha kwenyere na udo ga-achị na ntuliaka na-abịa.

Ndị otu ọrụ nchekwa niile nọ n'Imo steeti nke gụnyere ndị uweojii, haziri emume a.

Nkenke aha onyonyo Uche Nwosu nke AA so binye aka

Ndị binyere aka n'akwụkwọ udo a gụnyere: Emeka Ihedioha nke PDP, Uche Nwosu nke AA, Linus Okorie nke YPP, Tony Nwulu nke UPP nakwa ụfọdụ ndị ọzọ.

Nkenke aha onyonyo Tony Nwulu nke YPP bịakwara

Ikedi Ohakim nke pati Accord, Hope Uzodimma nke APC nakwa Ifeanyi Araraume nke APGA bụ ndị osote ha nọchiri anya ha na mmemme ahụ.

Nkenke aha onyonyo Emeka Ihedioha nke PDP binyekwara aka

Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti bụ Dasuki Galadanchi, n'ozi nnabata ya, gwara ndị na-azọ ọkwa ka ha cheta na ha enweghi steeti ọzọ karịa Imo, ma dụzie ha ọdụ ka ha jiri udo kpọrọ ihe.

N'ofesi,

Ụlọikpe dị na mba Amerịka achọtala ihe n'aka Joaquin Guzman bụ onye mba Mexico na-atụ mgbere ọgwụ ike a ma dị ka El Chapo.

Image copyright Reuters

N'agbanyeghi na a mabeghi ya ikpe, a na-ekwu na e nwereike ịtụ ya nga mkpụrụọka ga-eme ka ọ nọgide n'ụlọmkpọrọ ruo oge ọnwụ ya.

Gee nkeji BBC Igbo ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu na BBC Igbo