Nigeria Election 2019: Ụlọọgwụ sị na mmadụ 15 nwụrụ n'ọgbakọ APC mere na Rivas

Ụlọọrụ dị na Rivas steeti gwara BBC na ụmụnwaanyị iri na abụọ na ụmụnwoke atọ Image copyright Tonye P Cole

Dịka ụlọọgwụ e bugara ozu ndị a si gwa BBC, ihe karịrị mmadụ iri na abụọ nwụrụ n'ọgbakọ achụmnta vootu ndị pati nọ n'ọchịchị mere na Pọt Hakọt.

Ụlọọgwụ "University of Port Harcourt Teaching Hospital", (UPTH) kwuru sị na ọ bụ mmadụ 15 nwụrụ n'ọgbọegwuregwu Adokiye Amiesimaka, ka otu 'All Progressive Congress" (APC) mere achụmnta nke ọkwa onyeisiala n'ụbọchị 12 nke Febrụwarị, 2019.

Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọgwụ ahụ bụ Kem Elebiga, kwuru sị na ndị nwụrụ na ngalaba ihe mberede, "Accident and Emergency" ha bụ mmadụ iri na ise; ụmụnwaanyị iri na abụọ na ụmụnwoke atọ.

Image copyright Tonye P Cole

Elebiga kwuru na ndị dọkịta ha lekọtara mmadụ iri na abụọ ndị merụrụ ahụ site na nzọgbu dapụtara n'ọgbakọ ahụ, ma kwuo na mmadụ atọ n'ime ha alaala ebe mmadụ ise nọ n'ọnọdụ amabeghi nke a ga-eme ya.

Akụkọ kwuru na nzọgbu a mere ka igwemmadụ ji ọsọ na-eleghi anya n'azụ na-ekwopu ka ọgbakọ ahụ bịara na ngwụcha.

Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Rivas steeti kwuru sị na kọmishọna ndị uweojii bụ Usman Belel enyela iwu ka e nyochaa ihe butere nzọgbu a.

Ebe ndị ọzọ nzọgbu mere n'ọgbakọ achụmnta vootu 2019

  • Bọrọnu steeti - Amaghị ọnụọgụgụ mmadụ ole merụrụ ahụ na nzọgbu Bọrọnu
  • Taraba steeti - Ihe nwụrụ n'ọgbakọ achụmnta vootu mere n'ụbọchị asaa nke ọnwa Febrụwarị ruru mmadụ asatọ
  • Sokoto steeti - Amaghị mmadụ ole nwụrụ na nzọgbu aNigeria stampede don kill ppipo also for rally dis election season, ad all of dem na APCpresidential rally.

Ihe jikọrọ nzọgbu ndị a bụ na ha mere n'ọgbakọ achụmnta vootu ndị APC.

N'akụkọ yiri ya, ebe mgbakwasị ụkwụ meghere, ndị PDP na-achụ nta vootu adaba n'ime ya na Kebbi steeti.

Akụkọ ga-amasị gị: