Nigeria Elections 2019: Nkwado ntuliaka n'Ọwụwa Anyanwụ ebirila ọkụ

Ngwaọrụ Inec

Ntuliaka ọkwa onyeisiala na nke ụlọomeiwu fọrọ naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ, kedụ ka eke si anya anwụ n'ọwụwa anyanwụ?

Ndị ntaakụkọ BBC Igbo wuchiri ụlọọrụ ndị Inec nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ịgba anya tọọchị, wee hụ etu ha si akwado maka ntuliaka a.

Ihe anyị hụrụ:

N'Abịa steeti:

Ụlọọrụ Inec nke Abia Steeti na-eke ajị n'ume maka ntuliaka ga-adị na Satọde.

Otu onye ọrụ Inec na-arụ na ngalaba technuzu aha ya bụ Ugochukwu Nwokorie, gwara BBC Igbo na ha akwadola igwe kaadị rida, igbe ntuliaka nakwa ihe ndị ọzọ dika o kwesịrị ịdị ma gụkọọ ya na wọọdụ na wọọdụ.

O kwuru na e meecha nke a, na ha ga-ezipu ngwaọrụ ndị a gaa okpuruọchịchị dị iche iche n'Abia Steeti.

N'Anambara steeti:

Ndị ụlọọrụ Inec n'Anambara kwuru na ha anatala ngwaọrụ mafere ofe si n'ihe karịrị steeti asaa.

Onyeisi ụlọọrụ Inec nke Anambara Steeti, bụ Dọkịnta Nkwachukwu Oji, dụrụ ndị niile tozuru ịtụ vootu n'Anambara Steeti ọdụ ka ha jikere maka nke a n'ihi na egwu adịghị.

Cheta na ọkụ gbara ụlọọrụ ha, ebe ha dọwara nke e kenyeburu ha, n'ụbọchị 12 nke ọnwa Febrụwarị a, mana Inec kwuru na ntuliaka ga-aga n'ihu.

Nkenke aha onyonyo Ndị ụlọọrụ Inec, ndị gụnyere ndị ji otu afọ efe ala nna ha ka a hụrụ ebe ha na-enye aka ihazi igwe e ji enyocha akwụkwọ e ji atụ vootu bụ 'Card Readers', n'Anambara Steeti

Ha nwetara ngawọrụ gụnyere igwe kaadị rida e ji eme ntuliaka, akwụkwọ mbinyeaka na ihe ndị ọzọ.

Nkenke aha onyonyo Ha na-eme nyocha igwe e ji eme ntuliaka

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a