Atiku: Ngalaba EFCC anwụchiela onye ọkaiwu ya

Akụkọ dị mkpa:

Atiku Abubakar Image copyright @Atiku

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị EFCC anwụchiela onye ọkaiwu Atiku Abubakar bụ Uyi Giwa Osagie na Legọs.

E chere na a nwụchiri ya maka akpa ego e si Abuja ebuga Legos nke ndị ngalaba EFCC kpụghere mana o dobeghi anya ma nnwụchi a o metụtara ọrụ ya n' achụmnta vootu Atiku.

Image copyright @nysc_ng
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha.

Ngalaba Inec ekwela nkwa ilekọta ndị na-efe ala nna ga-eso ha arụ ọrụ ntuliaka anya ọfụma.

Cheta na ndị mmadụ kpụ Inec n'ọnụ maka etu ha si hapụ ụmụ mmadụ chi horo ụbọchị ehigharịrị ntuliaka.

BBC Igbo agbaala otu afọ,

Oru na Igbo BBC Igbo agbaala otu afọ na mgbasa ozi taa.

N'ụbọchị a n'afọ gara aga, ka BBC Igbo malitere mgbasaozi dịka otu n'ime ndị e kewapụtara na mgbakwunye BBC W2020 maka ndị asụsu na-abụghị bekee.

Obi dị anyị mma maka ncheta ọmụmụ ụlọọrụ a, ma na-asị chere aka ghọrọ anyị n'ike na ebube.

N'ofesi,

Steeti iri na isii gụnyere Kalifonia, agbaala onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, akwụkwọ, maka mkpebi ya itinye ọnọdụ gbatagbata maka inweta ego o ji arụ mgbidi aja maka oke ala ha na Mekziko.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gọọmenti mba US mechiri n'izu gara ga maka na ndị sineti akwadoghi bọjetị ha

Onye ọkaikpe ukwu nke Kalifonia bụ Xavier Becerra, kwuru sị na ha na-agba ya akwụkwọ a ime ka ọ ghara imefu ụtụisi ndị mmadụ tụtara.

N'egwuregwu,

Ọ ka na-akpọtụ n'isi ndị Chelsea, ka ndị Man Utd gosiri ha nkarị ma jiri ọkpụ goolu abụọ gbapụ ha n'asọmpi Iko FA.

Ajụjụ bụzị 'isi Chelsea a ga-apụtakwa ma ha zute Manchester City n'agba ikpeazụ nke asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa a?

Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Lee ihe nkiri anyị nwere taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu: Ana m abịa n'ike na ebube

Isiokwu Ndị Emetụtara