Custom Officer: Etu i kwesiri imeso onye ọrụ nchekwa bu egbe

Joseph Attah Image copyright Nigeria Customs Service
Nkenke aha onyonyo Ọnụ na-ekwuru ndị Kọstọm bụ Joseph Atta kwuru na ọ bụ ndị njem bu ngwaahịa iwu mabidoro banyere onye ọrụ ha ọgụ nke mere na mgbọ dị n'egbe o bu gbapụrụ tụọ onye nọrọ onwe ya.

Onye ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa bụ Kelechi Eze akpoola oku ka a kpubụ onye ọrụ Kọstom gbagburu mmadụ n'ụlọikpe ka ọ zara ọnụ ya.

Eze kwuru na onye mere ihe ọjọọ kwesịrị ka a kpụrụ ya gaa kpe ya ikpe na ọ bụghị igbagbu ya dịka onye ọrụ Kọstọm mere.

Ihe onyonyo fegharịrị na mbido izuụka a gosiri ebe otu onye ọrụ Kọstọm gbagburu otu nwoke a kpọrọ, Godwin Onajaro, n'okporoụzọ awara awara si Shagamu gawa Benin.

Ngwa ngwa akụkọ ahụ pụtara, ọnụ na-ekwuru ndị Kọstọm bụ Joseph Atta gọpụrụ onye ọrụ ha.

Atta kwuru na ọ bụ ndị njem bu ngwaahịa iwu mabidoro banyere onye ọrụ ha ọgụ nke mere na mgbọ dị n'egbe o bu gbapụrụ tụọ onye nọrọ onwe ya.

Mana ụlọọrụ ụgbọala ahụ bu ndị njem bụ Iyare Motors gwara BBC na ọ bụ ụgha na ha bu ngwaahịa iwu mabidoro.

Onye ọrụ ụlọọrụ ụgbọala ahụ kpọrọ onwe ya Solomon kwuru na "onye ọrụ kọstọm gbara egbe ahụ ṅụrụ mmanya."

Ọ kọwara na ọ bụ okwu ego mere ka ọ gbaa egbe ahụ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Onye ọrụ kọstọm gbagburu mmadụ kwesịrị ị ga mkpọrọ'

Na nkọwa ya, Eze, onye na-arụ n'ụlọọrụ nchekwa ọ chọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na onye Kọstom kwesịrị ịga nga n'ihi na agwa ọ kpara megidere iwu.

O kwuru na ọ kara anwụchị onye na-ada iwu karịa ịgbabu ya.

Ụmụ Naijiria ndị ọzọ etinyela ọnụ n'okwu ahụ.

Ha na-ebo ndị Kọstọm ebubo ị nọchị ikpemkwụmọtụ sịte na ịzọtara onye otu ha.

Ihe i kwesiri imee ma izute onye ọrụ nchekwa

Eze nyere ọha mmadụ ndụmọdụ atọ etu ha kwesiri imeso onye ọrụ nchekwa bu egbe.

Lee ha:

1. Kwanyere onye ọrụ nchekwa ugwu

2. Ha kwa gị mee ihe, mee ya

3. Ọ bụrụ na i nweghị akwụkwọ, soro ha gaa ụlọrụ ha, i rue ebe ahụ irue ebe ahụ ịgwọ ụgwọ dịka iwu siri kwuo.

Isiokwu Ndị Emetụtara