Nigeria Election 2019: Ndị omekome agbagbuola otu onye ndu APC n'Imo steeti

Ọkọlọtọ otu APC

Ebe foto si, @BolajiAbdullahi/Twitter

O kwuru na ọ bụ ndị bu egbe atọ nọ n'ime ugboala ọkụọtọ ekeneeze gbagburu Ifeanyi Ozoemena dị afọ 49.

Ha kwuru na ọ bụ onyeisioche otu n'ime nkewa abụọ gbara na APC n'Imo steeti.

Akụkọ kwuru na a gbagburu ya dịka o mechara nzụkọ ndị otu ya n'abali tuzde.

Ndị uweojii kwukwara na ha ebidola nyocha zuruoke banyere ọnwụ ya iji ma maọbụ okwu ndọrọndọrọ butere ya.