Election rigging: Ụzọ asaa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru na ntuliaka

Ndị na-atụ vootu Image copyright Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari enyela iwu ọkụ ka ndị uweojii na ndị agha, ghara imere onye ọbụla a nwụchiri ka ọ na-anapụ igbe vootu na ntuliaka na-abịa ebere.

Mana ị ma na ọ bụghị naanị izu igbe vootu bụ ụzọ e si eme mago-mago na ntuliaka?

Lee ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dịka onyeisi na-ahụ maka ọchịchị obodo n'ụlọọrụ 'ActionaidNigeria' bụ Celestine Odo na osote onyeisioche 'Situation Room' bụ Ọkaiwu Esther Uzoma, kwuru bụ ụzọ ndị ọzọ:

1.Ịnapụ igbe vootu atụrụ atụ

Image copyright AFP

Ịnapụ igbe vootu atụrụ atụ bụ otu ụzọ were anya ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji atụgharị ihe ndị mmadụ tụrụ na vootu.

Iwu Naijiria dịka o siri gbasa ntuliaka, kwuru na onye dara iwu izu igbe vootu ga-aga mkpọrọ ọnwa iri abụọ na anọ.

2.Igo vootu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ire maọbụ zụọ vootu

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ego n'aka, n'aka, maọbụ tinye ya n'akpa ego ndị mmadụ iji zụọ vootu ha.

Celestine Odo kwuru na "ike ego na-abịa n'ụdị dị iche iche; O nwere nke bụ ịnara ndị mmadụ akara ụlọakụ na-etinyere ha ego."

3. Ikesa ihe onyinye

Ewezuga ego, ha na-enye ndị mmadụ onyinye dịka akwa, okpu, osikapa, nnu, mkpaọkụ, iji goro obi ha ma mee ka ndị ahụ kwe tụnyere ha vootu.

4.Idegharị ihe e dere

Image copyright Getty Images

A ka na-eme ọtụtụ ihe gbasara ntuliaka dịka mgbe ochie, nke mere na a na-edepụta mpụtara n'akwụkwọ.

Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na ụfọdụ ndịọrụ Inec na-akpa nkata degaharịa ihe ederala n'akwụkwọ mpụtara ntuliaka na wọọdụ, site n'iwere akwụkwọ mpụtara adịgboroja dochie nke ezigbo bụ ngụkọ ihe ndị mmadụ tụkọtara.

5.Ibi akwụkwọ ntuliaka adgboroja

Ibi akwụkwọ ntuliaka adịgboroja so n'ụzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru na ntuliaka.

Izu gara aga, akwụkwọ akụkọ kwuru na ndị uweojii nwụchiri mmadụ abụọ bu akpa akwụkwọ ntuliaka dị iri na anọ na Kano.

6.Ime ihe iyi egwu, ọgbaghara

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Agwa ndị uweojii na-akpasa ndị mmadụ nwere itinye egwu mee ka ụfọdụ ghara ịpụta mee ntuliaka

Ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eziga ndị agboro, ndị na-aga eyi ndị chọrọ ịtụ vootu egwu nke bụ na egwu anaghị ekwe ụfọdụ pụta tụọ vootu.

Ụfọdụ na-eyi egwu site n'ikpoju ndị ọrụ nchekwa dịka ndị agha na ndị uweojii n'ebe a na-eme ntuliaka dịka e mere n'Ekiti na Ọshụn steeti na nso nso a.

7. Ntọ/ịgbagbu onye ike n'obodo

Ụzọ ọzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru bụ ị tọrọ maọbụ igbu onye nwere agba ha mara na ndị mmadụ na-ege ntị n'okwu ya.

Ọkaiwu Esther Uzoma kọwara na e nwere ike ịkpachi onye nwere agba "ka ha ghara ịma etu e siri tụọ vootu."

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỤzọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si eme wuruwuru na ntuliaka

Na nso nso, e gburu onye nnyemaka Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti n'ihe gbasara ndị ntorobịa bụ Lawrence Ngozi, nakwa onyeisioche APC n'Ohimini na Benue steeti.

Ọtụtụ ndị nwere agba egburula maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijiria gụnyere Marshal Harry, onye bụbu osote onyeisioche otu pati All Nigeria People's Party (2003); Bola Ige, onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ikpe(2001) nakwa Funsho Williams, onye zọburu ọkwa Gọvanọ Legọs steeti n'okpuru PDP (2006).

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a