Ebonyi Fire: PDP na APC na-arụrịta onwe ha aka

Ebonyi Image copyright Ebonyi CPS

Ọkụ gbara ihe ruru ụlọ iri atọ n'obodo Nwofe nke dị n'okpuruọchịchị Izzi, n'Ebọnyị state ụbọchị Monde bụ Febrụwarị 18, 2019.

Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP na APC na-arụrita onwe ha aka n'ọdachi.

Mana ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na o dochabeghi anya ndị mere ihe a.

Otu onye uweojii nọ n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abakaliki achọghị ka a kpọọ aha ya n'ihi na ọ bụghị ọrụ ya ịgwa ọha okwu, gwara BBC Igbo na ha amabeghi ma ọkụ ọgbụgba ahụ o metụtara nsogbu dị n'etiti obodo na obodo, ka ọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii na ndị obodo ebe ihe a mere na-enwe mkparịtaụka ịmata ebe ya bụ mmiri si banye opi ụgbọghụrụ.

Gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi, ga-eme njem nleta ebe ahụ ụbọchị taa bụ Tuzde, Febrụwarị 19,2019.

Anyi ga-ewetara gị ka o si mee n'uju.

Akụkọ ga-amasị gị:

Akụkọ ka na-abịa