Nigeria Election 2019: 'Agaghị m atụ vootu makana atụọla ya atụọ'

Okwu nhigharị e higharịrị ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa kwesịrị ime n'ụbọchị Febrụwarị 16 ka bụ ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.

Ebe ụfọdụ na-ewe iwe na aka enwe abaala n'ofe maka ya bụ ntuliaka dịka ha na-ekwu na a tụọla ya bụ vootu, ndị ọzọ na-ekwu na ụjọ nwere ike igbochi ndị mmadụ ịpụta makana ndị agha nọ ebe ahụ.