Stray Bullet: Ugboro atọ mgbọ egbe tụrụ ndị Nollywood

Charles Okocha Image copyright Charles Okocha

Ọtụtụ oge ka a na-anụ na mgbọ egbe a gbara otu ebe gara ebe ọzọ gaa tụọ onye na-abụghị onye a chọrọ ịgba ya.

Na Naịjirịa, ụfọdụ oge ka ọ na-abụ mgbọ egbe gbapụrụ n'egbe ndị ohi oge ha na-akwa mgbọ.

Ụfọdụkwanụ, ọ na-esi n'egbe ndị nchekwa; ya bụ ndị agha na ndị uweojii.

Ụdịrị ihe mberede a egbuola ọtụtụ ndị mmadụ, mana mmadụ ole ma na o metụtala ngalaba na-ahụ maka mmepụta ihe onyonyo na Naịjirịa bụ "Nollywood"?

Lee mmadụ atọ mgbọ egbe a na-akpọ "stray bullet" tụrụ na Nollywood:

1) Charles Okocha:

Okocha e ji "Igwe Tupac" nakwa "Amoshine" mara maka ihe nkiri o merela, bụ otu onye ọnụ ya juru n'ekele maka ihe ọ gabigara.

N'otu ụbọchị ọ na-agaghị echefu echefu n'ọnwa Disemba nke afọ 2015, mgbọ tụrụ nwa amadi a n'afọ, mana e mechara e wepụta ya; o nwerekwalanụ onwe ya.

Site n'ihe o kọwara, mgbọ otu onye uweojii gbapụrụ ebe ha gara emume na Nnewi dị n'Anambara steeti, bịara tụ ya ebe ọ nọ ala na ya bụ emume.

Okocha kwuru na e wepụtara mgbọ isii n'ime ahụ ya, ebe otu onye ọzọ mgbọ tụkwara n'otu emume ahụ nwụrụ.

Tupu i lee ihe onyonyo a, mara na ihe ị ga-ahụ nwere ike ịgbakasị gị ahụ.

2) Henry Onyeka Nwankwo:

Henry Nwankwo e ji 'Henry Kleinz' mara bụ onye na-eme ihe ntecha a na-akpọ "make-up artist" na bekee ma bụrụkwa onye na-eme ihe nkiri.

Dịka o si kwuo, mgbọ tụrụ ya n'afọ 2017, na Jọs dị na Platu steeti, ka ọ na-ala n'ụlọ ịgwa nne na nna ya na ọ ga-aga mba ofesi ịga mahadum.

Nwankwo kwuru na mgbọ onye agha gbapụrụ makana ọkwọụgbọala jụrụ ịkwụsị enye ha aka azụ, tụrụ ya n'otele, gafee ma gbawaa ya mgbawara azụ ya.

Tupu i safeegharịa foto a, mara na ihe ị ga-ahụ nwere ike ịgbakasị gị ahụ.

Nwankwọ ka na-azọ ndụ ya ruo ugbua makana ihe na-ebe ka na-ebe; ọnaghị aganwu ije na-enweghi enyemaka.

3) Clems Onyeka:

Ọnwụ Clems Onyeka tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya, ọkachasị maka etu o si nwụọ oge ọ dị ka ọnwa ndụ ya achakewela.

Dịka akụkọ si kwuo, mgbọ tụrụ Onyeka ka ndị ohi nọ na-ezu ohi n'ụgbọala na-ebu ego ndị ụlọakụ.

Ha na ndị uweojii na-achụ ha nọ na-akwakọrịta mgbọ n'Asaba dị na Delta steeti, oge mgbọ tụrụ Onyeka si ebe ọ gara ime ihe onyonyo.

Ọ nwụrụ ebe ahụ tupu e nwee ike ibuga ya ụlọọgwụ.

Ihe a mere n'afọ 2014.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a