Fake News- Akụkọ na m etinyela akwụkwọ arụkwaghịm bụ ụgha

Osinbajo Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Osote Onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo so nna ya ukwu bụ Muhammadu Buhari azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 n'aha APC

Osote onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osinbajo ekwuola na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya etinyela akwụkwọ arụkwaghịm bụ ụgha.

Akukọ na-efegharị na soshal midia kwuru na Osinbajo were iwe n'ihi naonyeisiala Buhari kpọrọ nzụkọ ndị isi ọrụ nchekwa Naijiria na ndị gọvanọ ma a gwaghị ya, ma oge ọ gbalịrị isonye na ọgbakọ ahụ, ekweghị ka ọ banye.

Jackson Ude bụ onye na-arụrụ Atiku Abubakar ọrụ n'ihe gbasara mgbasaozi wepụtara ozi a na igwe tTwitter ya. naanị awa 1iri o jiri wepụta ya, mmadụ otu narị na irir anọ sara ya, otu puku mmadụ kegharịrị ya, ebe mmadụ puku na nari atọ gosiri mmasị ha.

N'ọsịsa ya n'igwe Twiter ya, Osinbajo onye tụrụ arịrị na akụkọ ụgha na-abawanye, kwuru na ya etinyeghị akwụkwọ arụkwaghịm ọbụla.

O kwuru na ya kwụ chịm na iso onyeisilaa Muhammadu Buhari n'ọrụ ịgbara ndị Naijiria odibọ.

Ohaneze enweghi nkewa ọbụla, anyị ka kwadoro Atiku - Nnia nwodo

Onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ekwuola na ihe mere o ji gwa ndị Igbo tụnyere Atiku Abubakar na Peter Obi akwụkwọ, bụ n'ihi na Atiku kwere nkwa ịghagharị ọchịchị Naịjiria ma ọ banye n'ọchịchị.

Nwodo kwukwara sị na Ohaneze na otu niile jikọtara ndị igbo kwekọrịtara na ọ bụ naanị nhazigharị ọchịchị a ga-edozi ọnọdụ ndị igbo na Naịjiria.

O kwuru na ndigbo nọzị n'oche azụ n'Naịjiria n'ihi na ọchịchị APC nke Onyeisiala Muhammadu Buhari, ejighi inye Ndigbo ọkwa n'ọchịchị ya kpọrọ ihe.

Nwodo kwuru na iji maa atụ, onweghi onyeisi otu nchekwa ọbụla bụ onye mpaghara ala Igbo maọbụ mbammiri.

O kwukwara ho ha sị na onye ọbụla were ikikere o nwere bụ PVC, pụta n'ụbọchị satọdee wee họpụta ezigbo ndị ndu.

Iji zaa ajụjụ banyere nkewa dị n'etiti Ohaneze, Nwodo kwuru na onweghi nkewa ọbụla; na "onye ọbụla na-ekwu okwu na-abụghị ya", dịka odeakwụkwọ Uche Okwukwu, "na-ekwuru onwe ya" na ọ bụghị n'aha Ohaneze Ndigbo.

Gọọmentị etiti

Gọọmentị etiti ekwuola ka echi bụ Febrụwarị 22, 2019, bụrụ ụbọchị ezumike ọha, ka ndị mmadụ nwee ike laghachị ọgbọ ntuliaka ha ebe ha ga-anọ atụ vootu n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa a.

N'ofesi,

Ihe ruru mmadụ iri asaa anwụọla n'ọkụ ọgbụgba n'isiobodo Bangladesh bụ Dhaka.

Ọkụ ahụ malitere ịgba n'otu ụlọ nkwakọba ihe ebe a dọwara kemịkal na-abara ọkụ, dịka ọkụ ahụ mechara si ebe ahụ gafere ụlọ atọ ndị ọzọ dị n'akụkụ ya.

Na Champions League,

N'agbanyeghi na Cristiano Ronaldo so gbaa bọolụ, ndị Athletico Madrid emeghi ebere ka ha ji ọkpụ goolu abụọ merie Juventus.

Ebe Man City ji ọkpụ goolu atọ ndị Schalke satara abụọ n'ime ya MERIE , n'agbanyeghi nchụpụ a chụpụrụ Otamendi.

Akụkọ BBC na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Lee ihe nkiri taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNigeria Election 2019: Etu ndị na-ebiputa ihe si erite uru n'oge ntuliaka