Anambra Mortuary Fire: Ọ bụghị eziokwu na o nweghị ihe gọọmenti mere- Gọọmenti Anambara

Izu ole na ole gara aga, ọkụ gbara ụlọzụ dị n’ime ụlọọgwụ ‘Enugwu-Ukwu General Hospital’, Anambra steeti.

Nke a metụtara ozu ọtụtụ ndị mmadụ.

Izu gara aga, ndị ezinaụlọ o metụtara mere ngagharịiwe na-ekwu na-ebunyebeghị ha ozu onye nke ha, ebe ụfọdụ na-ekwu na nkwa iti aka n'obi gọọmenti kwere ha na e mezubeghị ya.

BBC gbara ụfọdụ n'ime ha ajụjụ ndị kọwara iwe ha.

Anyị nụtakwara olu gọọmenti site n'ọnụ ndị isi ụlọọgwu nakwa ngalaba ahụike na steeti ahụ.

Gee ya n'uju n'ihe nkiri a:

Akụkọ ga-amasị gị: