Jay Jay Okocha: Gịnị mere eji achọ ịnwụchi ya?

Okocha bụ onye ọgba bọọlụ amaama

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu otu ụlọikpe n'obod Legọs enyela iwu ka anwụchie onye ọgba ọọlụ Naịjirịa ama a ama bụ J J Okocha maka ebubo na o ji gọmentị steeti ahụ ụgwọ ụtụ isi.

Akụkọ kwuru na akpụpụrụ ya ụlọikpe kemgbe afọ 2017 maka ya bụ okwu mana rue ugbua, Okocha apụtabeghị ịzara ọnụ ya.

BBC Igbo ghọtakwara na ebugharịrị ụbọchị o kwesiri ịpụta n'ụlọikpe ọtụtụ oge mana ọ mịtaghị mkpụrụ n'ihi na Okocha apụtaghị.

N'okwu ndọrọndọrọ

Taa ga-eme ya otu ụbọchị kpọm kwem ụmụ Naịjirịa ga-atụlịaka iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala ha n'afọ anọ ọzọ n'abịa

Cheta na ekwesiri ịme ntuliaka a n'ụbọchị 16 nke ọnwa Febụwari mana ngalaba INEC dọtiri ya dịka ọ fọrọ elekere asaa tupu ọ malite

Onyeisiala Muhammadu Buhari n'ozi o zipụrụ n'ụtụtụ a gwara ndị mmadụ ha atụla ụjọ maka mmekpa ahụ n'itu vootu ha n'ihi na nchekwa dịrị onye ọbụla

Ọtụtụ otu na-azọta maka ọdịmma ndị Igbo nwere nzụkọ mberede n'Enugwu were kwekọrịta na Ndigbo ga-akwado onye kwere ha nkwa ihazigharị Naịjiria.

N'otu aka ahụ katọrọ emume iji ndị agha eme ntuliaka.

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Venezuela bụ Micolas Maduro ekwuola na ọ ga-emechi oke ha na mna Brazil iji kwụsị ngwa enyemaka ịbata na ala ha.

O kwukwara na o nwereike ịgbachị oke ha na mba Colombia maka otu okwu a.