Fifa amachiela Chelsea maka izu ndị egwu bọọlụ na-etoghị eto

Bertrand Traore ka o ji uwe Chelsea oge ya banyere n'otu egwu ahụ n'afọ 2014

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Bertrand Traore nyere goolu anọ na asọmpi 16 o soro Chelsea gbaa

Fifa amachiela otu egwu bọọlụ Chelsea ịzụ ndị egwu were ruo afọ 2020 maka ịda iwu gbasara etu ha si emeso ndị egwu bọọlụ na-eto eto.

A dakwara ha nha paụnds 460,000, ebe a dara ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bụ 'Football Association' paụnds 390,000.

Ntaramahụhụ na-eme dịka fifa nyochachara ọzụzụ Chelsea zụụ ndị egwu bọọlụ ndị mba ọzọ erubeghị afọ iri na asatọ ndị gụnyere, Bertrand Traore.

Fifa kwuru na Chelsea gbajọrọ iwu ha ụgboro 29.

N'afọ 2017, otu ụlọọrụ akụkọ intanet a kpọrọ 'Mediapart' gbara n'anwụ na Chelsea na-ewe ndị egwuregwu etorubeghị afọ 18 n'ọrụ.

Akụkọ ga-amasị: