Presidential Address: Ihe iri dị mkpa Buhari kwuru n'ụtụtụ Fraide'

Muhammadu Buhari Image copyright @Mbuhari
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari gwara ụmụ Naijiria ha ekwela ka onye ọbụla nagha ha ịtụ vootu echi

A kowaala ozi onyeisi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari zipụrụ taa maka ntụliaka a ga-eme echi dịka nke kacha mma na okwu ọ kwurula kamgbe ọ ji were ọkwa ọchịchị.

N'ozi ọ gbasara n'isi ụtụtụ Fraide, Buhari gwara ụmụ Naijiria ka ha pụta tuo vootu ha echi.

Na mkparịtaụka ha na BBC nwere n'Owere bụ isi obodo steeti Imo banyere nke a, ndị ọnụ na eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị kọwara ozi a dịka nke kwesiri maka onyeisiala.

Onye bụbu onyeisi oche ndị ntaakụkọ na steeti Imo, Fidel Onyeneke, kọwara ozi onyeisi ala dịka nke kpalitere mmụọ ndị mmadụ ma nye ha obisike."Okwu onyeisi ala kwuru mara ezi mma n'ihi na ọ ga-enye ndị mmadụ obisike ị pụta mee ntụliaka".Onye e ji okwu ya agba izu n'ihe gbasara ọchịchị bụ Mma Olebara, kọwara ozi ahụ dịka nke gosiri ọchịchị onye kwuo uche ya.

"N'ime ozi ahụ, ị ga-ahụta na enweghị okwu dịka tigbuo zọgbuo dịka ọ dị na mbụ".

Image copyright @Mbuhari

Ọkammụta Uche Ebeze kwuru na onyeisiala bụ Mohammadu Buhari nọ taa gwa ọha na eze ndị Naịjirịa okwu dịka ezigbo onye ndú na abughi onye ọchịchị aka ike, maọbụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Pati APC, dịka ọ dị n'oge ndị gara aga.Ọkammụta Uche Ebeze gbakwunyere na onyeisiala mere ka ọ bụ onyeisiala n'okwu ya taa, dịka ọ gara n'ihu kwuo okwu banyere nchekwa, njikere maka ntuliaka ma rịọ ndị Naịjirịa ka ha pụta n'igwe tụọ vootu ha echi na-enweghị egwu ọbụla.

Lee ihe iri dịcha oke mkpa n'okwu Buhari kwuru n'ụtụtụ foro ntuliaka 2019:

1. Echi ka ntuliaka ga-ebido.

Echi ka anyị ga-ekwusi ike na o nweghị onye ga eweghazi Naijiria aka azụ dịka ụzọ ọchịchị onyekwuoucheya nke anyị hara onwe anyị

2. Ọchịchị onyekwuoucheya bụ ụzọ bakarrịchara uru iji họpụta ndị ndu obodo, ọ bụghị egwu achị ụkwa n'aka agba

3. O bu ihe a ga-eji ndidi, nnagide, ebere, uchu na amamihe na olileanya eme.

Ihe ndị a niile zuuru ezu n'ụmụ Naijiria. N'ihi ụdị mmadụ anyị bụ Ọchịchị onyekwuoucheya ga-atọ atọ n'ala anyị

Image copyright @Mbuhari

4. Ekelere m ụmụ maka ndidi ụnụ nakwa ikpa udo oge niile a na akwado ntuliaka, ọkachasị dịka ehigharịrị ntulika ụbọchị Febuwarị 16

5. Ụfọdụ chị obi n'aka na-eche n'oke ihe kara ime, mana ụmụ gọsiri ha na ụnụ bụ ọpụrụiche na mmadụ site na ịbụ ndị ọkpa udo na ịdịnaotu ala anyị

6. I kwere na Inec amatala ọrụ chere ya n'ihu.

Image copyright @Mbuhari

Anyị kwesịrị iwepụ obi abụọ, nwe okwukwe na Inec ga-eme dịka o kwesiri ma kwado ha imejupụta ọrụ ha dịị ala anyị.

7 Ekwela ka onye ọbụla nagha gị ikike dịị gị dịka nwa amala na onye ga-atụ vootu echi.

8. Itụ vootu pụtara na i kwenyere na Naijitria nakwa ihe dị mma ga-emere ala anyị nakwa ndị ya.

9. Egwu akụkọ ọgbaghara na ike ike atụla gị. Ndị ọrụ nchekwa ga-anọ ọrụ ihu na udo chịị ebe niile.

Ị ga atụli vootu gị n'ọnọdụ udo na enweghị egwu maọbụ mkpagbu ọbụla

10. Mejupụta ọrụ dịka onye ga-atụ vootu H na ntuliaka pụta tụnyere ọchịchị gị masịị gị, ọchịchị ga-euga ala anyị ebe kacha mma.