Leicester City: Brendan Rogers na Kolo Toure anarala ọchịchị

Brendan Rogers Image copyright Leicester City

Leicester City enyela Brendan Rogers ọrụ onye nchịkọta otu ha na-erughi ụbọchị atọ ha chụrụ Claude Puel.

Ka ha na-ewe Rogers chịkọtaburu otu egwuregwu Liverpool site n'afọ 2012 ruo 2015 n'ọrụ, ha kpọbatakwara Kolo Toure gbaburu bọọlụ ọtụtụ afọ n'Arsenal, Liverpool na Manchester City.

Ọ kpọbatakwara Chris Davies nakwa Glen Driscoll ga na-elekọta ahụike ndị otu a.

Cheta na Rogers na Toure rụkọrọ ọrụ n'otu egwuregwu Celtic, ebe Rogers buliri iko asaa n'ime otu afọ na ụma.

N'akwụkwọ ọrụ Rogers dị afọ iri anọ na isii binyere aka, ọ ga-anọ na Leicester City ruo ọnwa Juun afọ 2022.

Mmeri Buhari

Ọ bụrụ na ị nụbeghị, ka anyị gbaara gị ama na Onyeisiala Muhammadu Buhari alọghachịla ịchị Naịjirịa afọ anọ ọzọ.

Image copyright Getty Images

N'okwu o kwuru iji nabata mmeri ya, o kwere nkwa ịgbalị karịa mbụ n'ihe gbasara nchekwa, akụnaụba nakwa ibuso mpụ agha.

N'ịkpọpụta onye meriri, onyeisi Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru na Buhari nwetere vootu karịa nke onye zọrọ ọchịchị n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar, ma mezuo ihe iwu kwuru, nke mere o ji pụta ka onyeisiala.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Presidential election 2019: Buhari achakeela ọzọ

PDP Ajụla mmeri Buhari

Otu pati PDP ajụla ịnabata mpụtara kpọpụtara aha Buhari dịka onye meriri ntuliaka, ka ha na-ekwu na akaebe si n'ọgbọ ntuliaka dị iche iche gosiri na ọ bụ Atiku Abubakar ka ndị Naịjirịa họpụtara.

Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ nọ n'ọnọdụ ndị n'ọchị ndị n'akwa maka ndị ha kwadoro na ya bụ ntuliaka.

N'ofesi,

Ihe ruru mmadụ iri isii ka tọrọ n'ime ebe a na-ezo ezo egwuputa ọlaedo n'ime ala, n'obodo Sulawesi dị na mba Indoneshia.

Image copyright BNPB

Ndị ọrụ gbatagbata mba ahụ sị na otu onye anwụọla ebe a gụpụtarala mmadụ iri na atọ.

N'egwuregwu,

Goolu abụọ Angel Di Maria nyere na otu nke Meunier gbakpuru, nyere PSG mmeri na be ha ka ha zutere Dijon n'asọmpi Coupe De France.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIbeawuchi