Dangote: Ego Dangote arịala elu ọzọ

Aliko Dangote, ógaranya n'Afríka Image copyright Getty Images

Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ego niile Dangote nwere jiri ihe karịrị ijeri dọlla ise rịa elu n'ime sọsọ otu ụbọchị.

Nke a mere ka ọkwa ya na ndị kachasị bụrụ ọgaranya n'ụwa niile rigo na iri ise n'anọ.

Dangote ka bụ nwoke kachasị bụrụ ọgaranya na mba Afrịka.

Onyeisiala 2023 na nsonso a?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Rotimi Amaechi bụ onye chiburu Rivers Steeti n'etiti afọ 2007 na 2015

Dịka onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka 2019, ụmụ Naijiria ebidola ị ma atụ gbasara ndị ha chọrọ ka ha zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.

Ọtụtụ na ọkammuta Yemi Osinbajo na Nuhu Ribadu dịka osote ya maọbụ , Rotimi Amaechi nakwa Babatunde Fashola.

Na mba ofesi,

Ikuku kuru na Naịjirịa ekuola na mba Senegal dịka onyeisiala ha bụ Macky Sall meriri ntuliaka iji nọrọ n'ọkwa ya n'agba nke abụọ.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị ka mba Senegal mere ntuliaka ọkwa onyeisiala nke ha.

N'egwuregwu,

Ụlọ na-arụpụta uwe egwuregwu bụ PUMA anarala ogbo ha bụ NIKE ọrụ ịbiputara otu Manchester uwe egwuregwu

N'akwụkwọ PUMA na Man City binyere aka, njịkọ ha ga-ewe nde pounds narị isii na iri ise ma rue afọ iri.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

N'ụtụtụ

Image copyright Atiku

Olisa Agbakoba bụ onye ọkaiwu ukwu na Naịjirịa akpọkuola Atiku Abubakar ka ọ nabata mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala.

N'akwụkwọ Agbakoba zisara na Legọs, o kwuru na etu e si mee ntuliaka nke afọ a na mpụtara ya gosiri na ihe gbasara agbụrụ bịara "bọodụ".

O kwuru na APC na PDP ritere uru si n'etu e si tụọ ya bụ vootu.

Ọ gara n'ihu kwuo ka Atiku ghara ịga ụlọikpe nke ntuliaka makana ọ bụghị ihe kwesịrị ka o mee.

Briten kwadoro ntuliaka Buhari

Minista na-ahụ maka ihe banyere mpaghara Afrịka na mba Brịten bụ Harriet Baldwine kelela Onyeisiala Buhari maka mmeri o nwetara na ntuliaka e mere na Naịjirịa n'ụbọchị Satọde gara aga.

Image copyright Getty Images

Baldwin kwuru na ọnụọgụgụ Inec wepụtara na ọ bụ ihe e nwetere na ya bụ ntuliaka, bụ nke dịka nke e nwetere n'atụmatụ Bekee kpọrọ "Parrallel Vote Tabulation", wee na-asị ndị Naịjirịa nabata mpụtara a.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Election Result 2019: Mba Briten sị na mmeri Buhari kwụ ọtọ

YIAGA tinyekwara ọnụ

Nke a na-abịakwa ka otu na-ahụ maka oke ruru onye a na-akpọ "Youth Initiative for Advocacy, Growth and Advancement YIAGA AFRICA" kwuru na mpụtara ntuliaka a dị etu o kwesịrị ịdị, na ọ bụrụ adịgboroja.

Ha dekwara sị na mpụtara ntuliaka a dabara n'ogo ha nyochapụtara na o kwesịrị:

Ihe Mbaka kwuru maka mmeri Buhari

Onye ụkọchukwu ama ama bụ Rev. Fr. Ejike Mbaka ekwuola na ya ga-eji izu ụka a niile na-eto chukwu ma na-enwe aṅụrị maka mmeri Buhari meriri Atiku.

Image copyright Adoration ministries
Nkenke aha onyonyo Mbaka kwuburu na Buhari bụ "onye nzọpụta"

Mbaka kwuru na ọ bụ maka mkparị Peter Obi na ndị otu ya kparịrị ya ka o jiri daa ya bụ ntuliaka.

Gụọ ihe o kwuru n'uju ebe a: Fr Mbaka na-enwe nnukwu aṅụrị n'ihi na Buhari emeriela

N'ofesi,

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, na nke mba Nọt Korea bụ Kim Jung-Un, abanyela ụbọchị abụọ bụ ụbọchị ikpeazụ ha ga-ama ebe ha kwụ akwụ gbasara ihe bekee kpọrọ "denuclearisation".

Ka nzukọ a mechara n'ụtụtụ Febrụwarị 28, 2019, mmadụ abụọ a erughi na nkwekọrịta.

Image copyright Mary Evans Picture Library

Trump kwuru na "Anyị ekweghi ahọrọ asịsa ọbụla ha họpụtara" ma kwuo "Ọ gaara adị njọ ibinye aka nkewkọrịta n'ihe ọbụla".

Mike Pompeo bụ odeakwụkwọ kachasị nke mba Amerịka, kwuru na mba abụọ ahụ kwekọrịtara na ha ga na-agbalị ịhụ na isi pụtara n'isiokwu a.

N'ikpeazụ, Nọt Koria kwuru na ha chọrọ ka mba Amerịka wepụ iwu ha ji machibido ha, na ọ bụrụ na ha mee nke a, na ha bụ Nọt Koria ga-akụkasị ebe a na-arụpụta ngwaagha nuklia dị na Yongbyon, mana Amerịka ekwenyeghi.

Mana Trump kwuru na Jong-Un kwere ya nkwa na ọ ga-akwụsị ịnwale ngwaagha nuklia maọbụ mịsaịl nke na-agate aka.

N'egwuregwu,

Arsenal, Chelsea, Man United, Liverpool na Man City merichara ndị ọ bụ ha na ha na Premier League a gbara n'Abalị.

Arsenal na Liverpool nyechara goolu ise ise, Chelsea nyere goolu abụọ, Man Utd nyere atọ ebe Man City nyere naanị otu goolu iji merie.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe Nkiri BBC Igbo:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNdigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere