Rochas: Ọkwa Sinetọ nwere ike ifunahụ Okorocha - Ọkaiwu

Rochas Okorocha

Ọkaiwu Anthony Okah kọwara BBC Igbo aka mgba chere gọvanọ Rochas Okorocha n'ihu n'ihi nsogbu ya na pati ya bụ APC na-enwe.

Okah kwuru na nke a nwereike ime ka ọkwa Sịnetọ funahụ Rochas ma ọ bụrụ pati APC chụpụ ya n'otu ha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na APC chọrọ ịta ndị dara iwu ya ahụhụ, na ha kwesiri ịmalite n'ebe onyeisiala Buhari nọ maka na o so daa iwu site n'ịnabata nkwado ndị pati ọzọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkorocha's suspension: Ọkwa Sịnetọ nwereike ifunahụ ya - Ọkaiwu

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha ebola onyeisi oche pati APC ebubo ịkpa nkata mere eji kwụsị ya na ndị ọzọ iso pati APC.

N'ehihie ụbọchị Fraide ka okwu pụtara na APC achụọla Rochas Okorocha nakwa ogbo ya Ibikunle Amosun.

APC kwuru n'akwụkwọ ozi ha wepụtara na ọ bụ maka na ha kpara agwa megidere pati ha nke Bekee kpọrọ "Anti-party activities."

N'ọsịsa ya nke dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemeodo binyere aka, Okorocha kwuru na Oshiomhole na-agbasi mbọ ike ime pati APC n'Ọwụwa-Anyanwụ Naijiria.

Okorocha onye boro Oshiomhole ebubo ịhazi ntuliaka ime ụlọ wuruwuru n' Ọwụwa-Anyanwụ kwuru na ịchụpụ ya na pati nọ n'ọchịchị bụ iji nkata kuru mmiri.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Uche Nwosu

"Ebumnobi Adams Oshiomhole site n'ụtụtụ bụ ikposa APC na mpaghara ọwụwanyanwụ."

"Na mpaghara ọwụwayanwụ, e nwere ọgbaghara n'ihi ntuliaka wuruwuru ọ haziri."

Ọ gara n'ihu kwuo "Oshiomhole ịchụpụ m na APC bụ n'ihi egwu na Chineke n'obi ebere ya nwere ike ịkpọga m n'ụlọomeiwu ukwu."

Ndị imeobi APC chụtukwara n'ike maka ịkpa agwa megidere pati ha gụnyere Mịnịsta na-ahụ maka Niger Delta bụ Pastọ Usani Uguru Usani nakwa onyeisi Voice of Nigeria (VON), bụ Osita Okechukwu.

Ndị imeobi APC nwere mkpebi a ụbọchị Fraide n'ọgbakọ ha nwere n'isi ụlọọrụ APC dị n'Abuja nke onyisioche ha bụ Adams Oshiomhole nọ n'isi ya.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionImo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha

Ndị niile BBC kpọtụrụ ịmanye ọnụ n'okwu a na-ekwu na ha anụghị maka ya.

Ha gụnyere Ebere Nzewuji, Sam Onwuemeodo nakwa onyeisioche pati APC n'Imo bụ Dan Nwafor.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIbeawuchi

Okorocha na Amosun zọtara oche n'ụlọomeiwu ukwu n'okpuru APC mana ha na-akwado ndị mmadụ anọghị na APC maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ na-abịa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionRochas: Ipob na Biafra abụghị otu ihe

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a