Presidential Election: Ọ bụ iji maja m kweta kele Buhari- Atiku

Akụkọ dị mkpa

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2019 n'aha PDP bụ Atiku Abụbakar ekwuola na ya anaghị akụja akụja dịka EFCC nwụchiri onye nhazi ego n'ụlọọrụ Babalele Abdulahi.

A nwụchiri Abdulahi , onye bụkwa ọgọ Atiku ụbọchị Satode, abali abụọ nke ọnwa Maachị n'Abuja.

N'akwụkwọ mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Paul Ibe nyere ndị ntaakụkọ, Atiku kwuru na nwanne nwunye onyeisiala Naijiria degara EFCC mkpesa nke mere ha jiri wakpo ụlọ na ụlọọrụ onye nhazi ego n'ụlọọrụ ya mana o nweghị ihe ha hụrụ.

Mana Atiku onye kwuru na ha were akwụkwọ ụlọ nwa amadị ahụ, ṅụrụ iyi na ya "agaghị atufu oku ụmụ Naijiria kpọrọ ya na ntuliaka e mere n'abalị 23 nke ọnwa Febụwarị."

Presidential election 2019: O nweghị mgbe anyị nye ọnọdụ mkpezi- PDP

Otu PDP ekwuola na akụkọ na Atiku nyere ọnọdụ ya ga-eji hapụ okwu gbasara onye meriri na ntuliaka 2019 bụ okpokpo asi.

Ha kwuru na Atku enweghị ihe maọbụ ọnọdụ a ga-enye ya o were gbahapụ inweta ikpemkwụmọtọ n'ebubo na onyeisiala Muhammadu Buhari mere wuruwuru na ntuliaka emere n'abali 23 nke ọnwa Febuwari.

PDP kwuru na ha nwere nke bụ ezigbo mpụtara ntuliaka ahụ nakwa ihe ngosi na APC na Inec gbara okwe nke ha ga-egosipụta n'ụlọikpe.

Ehi anyị na-enwe ọṅụ n'ihi mmeri Buhari - Miyetti Allah

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri

Otu jịkọtara ndị ọchịehi na Naijiria a kpọrọ Miyetti Allah ekwuola na obi na-atọ ndị Fulani nakwa ehi ha ka nnu maka mmeri onyeisiala Muhammadu Buhari meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere na nso nso a.

Ha nyekwara Atiku Abụbakar ndụmọdụ ka ọ gawa ụlọikpe ma ọ bụrụ na mkpebi ahụ adịghị ya obi mma.

Na mkparịtaụka ha na ụlọ ntaakụkọ 'Sun' nwere, onyeisi otu ahụ bụ Bello Abdullahi Bodejo kwuru na 'Kemgbe izu abụo, anyị anyị akwadola ehi ndị anyị ga-eji mee ụghara maka mmeri Baba Buhari."

" Ihe anyị na-eche ugbua bụ ntuliaka gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti.

" Gọvanọ ndị kwadoro iwu megidere ịchịgharị ehi agaghị alọghachi."

Ụmụnwaanyị APC Imo mere ngagharị iwe

Ụmụnwaanyị otu APC n'Imo steeti mere ngagharịiwe n'ụbọchị Satode maka ọrụ a kwụsịrị Rochas Okorocha n'ike n'ụbọchị Fraide.

Ha na-ekwu na o nweghị njọ Okorocha mere n'ikwado ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu na ntuliaka na-abịa..

Cheta na otu onye ọkaikpe bụ Anthony Okah ekwuola na oche sineti nke Rochas meriri nwere ike ifunahụ ya ma ọ bụrụ na achụpụ ya n'APC n'ihi nọ bụ ọnọdụ ọ kwụdoro zọọ ọkwa ahụ.

N'otu aka ahụ

Image copyright Getty Images

Ngalaba INEC ekwuola na ha ga-emegharị ntuliaka n'ụfọdụ ebe o meghị na mbụ n'abalị itoolu nke ọnwa Maachị.

O kwuru na ebe ndi gụnyere ebe ọgbaghara dapụtara nakwa ebe akụrụngwa Inec nwere nsogbu dị icheiche.

Mana onye bụbu odeakwụkwọ APC bụ Timi Frank ekwuola na ọ dịka ịnye ozu ọgwụ.

"Ndị na-efe ala ha agaghị arụ ọrụ ntuliaka n'ebe e nwere ọgbaghara"

Image copyright @nysc_ng
Nkenke aha onyonyo Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha.

Ngalaba na-elekọta ndị na-efe ala nna ha bụ NYSC ekwuola na o nweghi onye otu ha ga-arụrụ Inec ọrụ na-ebe enwere ọgbaghara na ntuliaka ọkwa gọvanọ nke na-abịa

Ọnụ na-ekwuchitere ngalaba ahụ bụ Adenike Adeyemi kwuru nke a kọwara na o nweghị otu n'ime ha nwụrụ na ntuliaka nke gara aga.

Na mba ofesi,

Onyeisiala ọhụrụ mba Kongo bụ Felix Tshisekedi ekwuola na ọ chọrọ ịtọghapụ ndị nọ n'ụlọ mkpọrọ anwụchiri maka ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime ụbọchị iri.

O kwuru na nke a bụ iji kwad oọchịchị onyekwuoucheya na mba ahụ.

N'egwurewgwu,

Aha Peirre-Emerick Aubameyang nke Arsenal na-ewu na soshal midia maka ọkpụ penariti ọ gbahiere oge ha zutere Tottenham na Satode.

Arsenal na Tottenham gbara onwe ha onye laba, onye laba na ya bụ asọmpị.

Gee akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Accord na-akwado APGA n'Abia Steeti

Onye ji aha pati Acoord azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti bụ Emeka Uwakolam awụsala ọwa n'ịzọ ọkwa ahụ ma dọnyere ogbo ya nke pati APGA bụ Alex Otti ukwu.

Uwakolam kwuputara nke a mgbe ọ kpọ ndị na-akwado ya gaa n'isi ụlọọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Alex Otti dị n'Umuahia ụnyaahụ.

O kwuru na-agbanyeghi na o nwere ọnụnụọkụ n'obi ijere Abia Steeti ozi na ọ na-enye ohere ka onye nwere ikike karịa ya chịa Abịa.

Na nzaghachi Otti kwuru na Uwakolam so na ndị na-azọ ọkwa gọvanọ kachasị sie ike n'Abia Steeti, o kwuru na ya na Uwakolam kwenyere n'otu ihe bụ ịkagbu Papa ukwu na ndọrọ ndọrọ Abia.

NTA, AIT, Channels na ndị ọzọ adaala iwu NBC

Image copyright NBC/Facebook

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasa ozi bụ National Broadcasting Commission eriela ụlọọrụ mgbasa ozi dị iri anọ na ise iwu maka ịda iwu na-echekwa mgbasa ozi na Naịjirịa.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Malam Is'haq Modibbo kwuru na ụlọọrụ ndị a gụnyere NTA, AIT, Channels na ndị ọzọ ga-akwụ ego dị puku narị naịra ise maka ịda iwu a.

N'ofesi

Image copyright Getty Images

Ezinaụlọ nwata akwụkwọ mba Amerịka bụ Otto Warmbier onye nwụrụ n'ihi mkpọrọ atụrụ ya na mba Nọt Korịa akatọọla Donald Trump maka ito onyeisiala mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-Un.

Nne na nna Warmbier kwuru na onweghi ụdị otito ga-eme ka ha chefuo na ọ bụ ọchịchị ọjọọ Kim gburu nwa ha nwoke.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Ehihie a ga-ekere ọkụ dịka Tottenham ga-ezute Arsenal, Bournamouth ga-anabata Manchester City ebe Manchester United ga-ele Southampton ọ bịa n'asọmpi Ịnglish Premier.

Nkeji ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIbeawuchi

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a