Abia Election Results: Ikpeazu eburula ụzọ n'Abia steeti

Okezie Ikpeazu Image copyright John Okiyi

Aka na-achị Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu ka kwụ chịm ugbua dịka o meriri ntụlịaka ọkwa gọvanọ na steeti ahụ.

Ọ bụ na mgbede ụbọchịụka ka akpọpụtara aha ya dịka onye meriri mgbe a gụkọchara mpụtara si n'okpuruọchịchị niile dị n'Abia.

Ndị na-anọchite anya ndị APC na APGA ji iwe apụ n'ebe a na-eme mkpọpụta mpụtara n'Abịa steeti ugbua.

Ha kwuru na ha agaghị anabata mpụtara a na-akpọpụta.

Lee ka e si akpọpụta ya nakwa ihe bụ iwe ha ebe a.

Alex Otti na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abịa steeti kwuru na o nwere olileanya na ebumnuche ndị mmadụ ga-emezu.

Image copyright Twitter/Alex Otti

O kwuru nke a n'elu Twitter ya ka ọ tụchara vootu.

O kwukwara sị na udo dị ebe ọ nọ mee ntuliaka, kama na ọ nụrụ kepu kepu na e nwere ndị nwara ike ha imaburu igbe ntuliaka.

Ọ rịọkwara Inec arịrịọ ka ha gbaa mbọ lebanye anya n'okwu a.

Ikpeazu na-atụ anya mmeri:

Ikpeazu na-azọ ịchị Abịa steeti n’agba nke abụọ ya ekwuola na o kwenyere na mmeri ya kpam kpam.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionElection 2019: 'Ama m na mmeri ga-abụ nkem'

Ihe ndị ọzọ o tinyere ọnụ na ya bụ okwu gbasara ndị nchekwa na ụzọ ha si esonye n'igbochi nrụrụaka.

Ntuliaka ebirila ọkụ n'Abịa steeti ugbua, dịka ndị mmadụ na-atụ vootu ha.

Okezie Ikpeazu bụ aka na-achị Abịa ugbua ma na-atụ anya ịlọghachịte ọzọ, atụọla vootu ya na wọọdụ ya dị n'Umuobiakwa n'Obingwa.

Nwunye ya sokwa tụọ vootu

N'Enugwu na Ebọnyị

Dịka a na-akwado ime ntuliaka ọkwa gọvanọ n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Febrụwarị a, ị ma ndị na-azọ ọchịchị n'Enugwu na Ebọnyị steeti?

Image copyright Facebook

N'agbanyeghi na ndị na-achị steeti abụọ a na-atụ anya ịlọghachịta ọchịchị nke ugboro abụọ, e nwere ndị na-atụkwa anya ịnapụta ha ọchịchị n'aka.

BBC Igbo na-egosi mmadụ atọ ndị a kacha kpụrụ n'ọnụ n'ime igwemmadụ pụtara ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti abụọ a, na ebumnobi ha ma ọ bụrụ na ha zọta ọchịchị.

Dịka anyị si hụ ebe ndị mmadụ binyere aka ịhọpụta ndị ha ga-atụnyere vootu, lee ndị kacha welite isi na steeti abụọ a.

ENUGWU STEETI:

1) Ifeanyi Ugwuanyi:

Ugwuanyi bụ onye na-achị Enugwu steeti ugbua, na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Peoples Democratic Party (PDP).

Ugwuanyi a ma dịka "gburu gburu", na-ekwe nkwa ịrụ ọrụ karịa ihe ọ rụrụ n'agba nke mbụ ọ chịrị.

Image copyright Enugu State Government

Ihe kacha tụọ ndị mmaọ̄ụ n'anya bụ etu ihe karịrị pati iri atọ kwụsịrị ịzọ oche gọvanọ n'Enugwu steeti, ka ha nwee ike ikwado ya.

Ugwuanyi dị afọ 54, kwere nkwa ezi ọchịchị, ịhụ na ndị mmadụ nwere ọrụ, imepe obodo nakwa nchekwa oge ọ zọtara ọchịchị n'afọ 2015.

Orji Jide Abraham:

Ọrji dị afọ 43 na-azọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati National Action Council (NAC) nke ọ bụkwa onyeisioche ya n'Enugwu steeti.

Image copyright Facebook/Orji

APC

Otu pati APC enweghi onye na-anọchite anya ha, makana ha nwere okwu n'ụlọikpe gbasara ndọrọndọrọ dị n'etiti Ayogu Eze na George Oghara na-azọ onye natara ikike ife ọkọlọtọ pati ha.

Nke a mere ka Inec wepụ aha ha n'akwụkwọ.

EBỌNYỊ STEETI:

David Umahi:

Ọ bụrụ na Umahi na-azọ ọchịchị n'okpuru Peoples Democratic Party (PDP) zọta oche nke 2019, ọ ga-abụ nke agba abụọ ọ ga-achị steeti ya.

Ọ rụrụ dịka osote gọvanọ oge Martin Elechi chịrị Ebọnyị n'afọ 2011.

Umahi dị afọ 55, nọ ọnọdụ ugbua dịka onyeisioche ndị gọvanọ si mpaghara ọwụwa-anyanwụ.

"Akụbaraọha" dịka ndị mmadụ na-etu ya, gụrụ akwụkwọ dịka ihe bekee na-akpọ "Civil Engineer".

O kwere nkwa ịrụ ọrụ karịa ka ọ rụrụ ma ọ bụrụ na a tụnyere vootu ga-eme ya gọvanọ ọzọ.

Sunny Ogbuoji:

Ogbuoji dị afọ 64 na-azọ ọkwa ọchịchị n'okpuru All Progressives Congress (APC), bụ sinetọ na-anọchi anya Ebonyi Saụt kemgbe afọ 2011 ruo 2019 a.

Ọ rụọla ọrụ dịka onyeisi okpuruọchịchị Afikpo, oge ndị agha na-achị Naịjirịa.

Image copyright National Assembly

Ọ rụkwara ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka mwepụ ụbịam na ikwalite akụnaụba obodo oge Martin Elechi bụ gọvanọ Ebọnyị steeti.

O si na PDP gafee APC, n'agbanyeghị na ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-achịkọta achụmntavootu Goodluck Jonathan na Namadi Sambo.

Ogbuoji na-ekwu na ọ bụrụ na ọ zọta ọkwa gọvanọ, na ọ ga-agbado anya n'ịchịkọta Ebọnyị n'ụzọ niile, ma hụkwa na e were ọtụtụ ndị Ebọnyị n'ọrụ.

Chibueze-Agbo Ndubuisi Onwe:

Chibueze-Agbo dị afọ 46 na-azọ ọchịchị n'okpuru pati Social Democratic Party (SDP).

Chibueze-Agbo rụburu ọrụ dịka kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ oge Martin Elechi na-achị dịka gọvanọ Ebọnyị.

Image copyright Facebook/Agbo

O kwuru na ọ bụrụ na ọ zọta ọkwa gọvanọ, na ọ ga-gbado anya n'ihe gbasara agụmakwụkwọ, ahụike, nchekwa nakwa ọrụ ugbo.

Ọ sị na gọọmentị ya ga-enye ntorobịa ọbụla si Ebọnyị N120,000 ha ga-eji bido ọrụ, nke ha ga-akwụghachị gọọmentị puku narị n'ime ya ma ọnwa isii gafechaa.

O si APC ebe ọ nọ na-azọbu oche n'ụlọomeiwu nta, gafee SDP ebe ọ na-azọ ọkwa gọvanọ, n'afọ 2018.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a