Emeka Ihedioha: O meriela ọkwa gọvanọ nke Imo

Mmeri Ihedioha

Inec akpọpụtala aha Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti.

Image copyright Emeka Ihedioha/Facebook

O meriri ndị nnukwu mmadụ dịka Hope Uzodinma, Ifeanyi Araraume, Uche Nwosu, Ikedi Ohakim nakwa Linus Okorie, iji zọta ya bụ oche.

Ihedioha ji vootu 273,404 were merie onye nke abụọ bụ Uche Nwosu zọrọ n'okpuru pati AA, ebe o nwetara vootu 190,364.

Onye bụ Emeka Ihedioha?

Image copyright @Emeka Ihedioha/Facebook

Emeka Ihedioha dị afọ 53 bụ onye ọrụugbo nke ukwu nwekwara ụfọdụ ụlọoriri nakwa ahịa mmanụ agbịdị.

Ọ zọtara oche n'ụlọomeiwu nke nta n'afọ 2003 ịnọchi anya Aboh-Mbaise-Ngor Okpala.

O mechara bụrụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu nta site n'afọ 2011 rue afọ 2015 ma bụrụkwa onyeisi ụlọomeiwu nke nta.

Ọ malitere ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru PDP dịka o meriri ntụliaka imeụlọ nke ha haziri.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a