Emeka Ihedioha: 'Ya nyere anyị aka butuo ụgwọisi ụmụnwaanyị Mbaise'

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionEmeka Ihedioha: M ga-edozi ihe mebiri emebi n'Imo steeti

Emeka Ihedioha bụ onye meriri na ntụliaka nke ọkwa gọvanọ emere n'Imo steeti ekwuola ọtụtụ ihe ọ ga-emere ndị Imo.

Otu n'ime ihe o kwuru na ọ ga-eme bụ imezi ihe mebiri emebi na steeti ahụ. Gere ihe ndị ọzọ o kwuru n'ihe nkiri a.

Ka ndị mmadụ ka na-enwe aṅụrị maka mmeri Emeka Ihedioha meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti, ndị ọzọ ekwuola ihe ha chọrọ n'aka ya.

Image copyright Facebook/Ihedioha

Ebe ụfọdụ na-achọ ka ọ rụọ ụzọ, ụlọọgwụ na ihe ndị ọzo, ụfọdụ chọkwara ka ọ kụtuo akpụrakpụ Rochas Okorocha rụrụ.

@JerryWright4 dere na Twitter sị ka Ihedioha lebanye anya n'ihe gbasara ibutu ụgwọisi ụmụnwaanyị Mbaise, maọbụ ka gọọmentị nyeretu ha aka ịkwụ ya bụ ụgwọ mgbe ha chọrọ ịlụ nwaanyị.

Emeka Ihedioha kwere ndị Imo steeti nkwa na ọ gaghị awụ ha n'ala dịka ha si n'aka ntuliaka họpụta ya dịka onye ha chọrọ ka ha chịa.

Image copyright Twitter/EmekaIhedioha

O kwuru nke a site n'ihe o dere n'elu soshal midia, ebe o dere sị "Ndị Imo daalụ. Mmeri a bụ nke anyị niile! Agaghị m awụ unu n'ala! Okwu m bụ nkwa m na-ekwe!"

Cheta na Ihedioha nwetara vootu 273,404 iji merie ndị ọzọ ya na ha so zọo ọkwa.

Ihe ndị mmadụ chọrọ n'aka ya:

Charly boy si Imo steeti ma bụrụkwa onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, kwuru sị na ọ na-atụ anya na ọchịchị Ihedioha ga-abụ olileanya nye ndị Imo. Ọ sịkwa ya "kwanyere onwe gị ugwu".

@MrStanleyNwabia kwuru na ihe mbụ Ihedioha kwesịrị ime ma ọ banye ọchịchị bụ ibugharị akpụrakpụ niile ahụ Rochas Okorocha kpụrụ, buga ya n'obodo Rochas.

@DuruchibuzorE kwuru na ugbua ka ọ ga na-alaruzi obodo ya makana Imo steeti esila n'aka "ndị na-akpụ" ihe pụta.

@DaChinagorom rịọrọ ya sị ya gbaa mbọ hụ na o mere ka Imo steeti bụrụ ebe a na-arụpụta ihe dịka Abịa na Anambara.

@iamLORDTM kwuru sị na ọ dị mma na a napụtara ọchịchị n'aka onye chọrọ ime ka ọ dịrị naanị n'ezinaụlọ ya.

@kingpado01 kwuru sị ka ọ gbaghachaa ala ndị "e zuru ezu".

@Buchyogba kwuru sị ya gbaa mbọ rụgharịa ụzọ ndị adịghị mma, kwụọ ndị ọrụ bekee e ji ụgwọ ọnwa, ma nyochaa ọchịchị Rochas.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a