Juventus vs Atletico Madrid: C Ronaldo dọriri Atletico Madrid ka agụ

C Ronaldo Image copyright Getty Images

Ụdịrị goolu ndị Man City ji gbakachaa neetị ha mere ka ndị mmadụ na-ajụ ma ndị Schalke ejibu ha ụgwọ ha na-akwụghị.

Goolu asaa Sergio Kun Aguero (abụọ), Leroy Sane (otu), Raheem Sterling (otu), Bernardo Silva (otu), Phil Foden (otu) na Gabriel Jesus (otu) kekọrịtara n'etiti onwe ha zuru ịkpọ ntu n'obe ndị Schalke, gosi ha na "ọbịara abịa ga-alarịrị."

Na mkpokọta, Man City na Schalke gbatara 10 - 2 na nzukọ abụọ ha zukọrọ.

Image copyright Getty Images

Site na mmeri a, Man City ekwoferela banye n'agba nke anọ-ikpeazụ.

Ronaldo dọriri Atletico Madrid ka agụ

N'agbanyeghi na ọ bụ mkpokọta ihe ruru mmadụ 22 gbara bọọlụ n'ọgbọ ewuregwu Allianz, ọ bụ "ajọ anụ" Cristiano Ronaldo ka onye ọbụla kpụ n'ọnụ.

Nwaamadị a gosiri na ọ ka bụ dike ọgụ n'aha gbasara egwuregwu bọọlụ, ka o ji goolu nyejuo ndị Atletico Madrid afọ.

Antoine Griezmann so na ndị Atletico ji aba mba achịtaghị aja ka Juventus ji ha chụọ aja ndị mmụọ.

Goolu atọ o nyere na nkeji 27, 48 na 86, zuru inye Juventus mmeri ma mee ka ha nwee ike igafe banye agba nke anọ-ikpeazụ, n'agbanyeghi goolu abụọ Atletico ji merie ha n'ụkwụ nke mbụ ha gbara na be ha.

Goolu atọ a emezuola ya goolu 124 ọ na-enye n'asọmpi Champions League, na goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke asatọ ya n'asọmpi a kemgbe o ji gbawa bọọlụ.

Ronaldo napụrụ Atletico ohere ha gaara eji mara ma ha a ga-eso zọọ iko a n'ọgbọegwuregwu ha bu Wanda Metropoitano, n'ụbọchị ikpeazụ nke asọmpi a.

Ndị ha ga-ezute

A ga-ahọpụta ndị otu abụọ a ga-ezute n'agba anọ-ikpeazụ n'ụbọchị Fraịde bụ Maachị 15.

Ndị fọrọ n'asọmpi a bụ Ajax, Man City, Juventus, Man Utd, Porto, Tottenham na onye ga-emeri n'etiti Liverpool/Bayern Munich na Barcelona/Lyon.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a