Ethiopian Airlines: India, UK na ndị ọzọ amachiela Boeing 737 Max

Akụkọ dị mkpa

Image copyright ANADOLU AGENCY

Mba Briten na mba Yurop ndị ọzọ amachiela ụgbọelụ 737 max niile ife na mba ha dịka ụgbọelu ahụ kpọkasiri n'ụtụtụ ụbọchịụka.

Nke mere ya ugboro abụọ ụdị ụgbọelu a na-akpọkasị n'ime ọnwa ise.

Ihedịọha: ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo

Image copyright Twitter/EmekaIhedioha

Onye merịrị na ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Chukwemeka Ihediọha ekwela ndị Imo nkwa na n'oge nke ya, "ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo."

Ihedioha kwuru nke n'ụlọ ya n'Owere ụbọchị Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

INEC kpọpụtara Ihedioha dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti emere n'abali itolu nke ọnwa Maachi.

Ụdị ọṅụ juru ndị mmadụ obi ka ya bụ ihe mere bụ ihe ụfọdụ ndị atụwaghị anya, makana ọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ ma n'ụzọ ma n'elu soshal midia, ruo ugbua.

N'aka nke ọzọ, Uche Nwosu nwetara ọnọdụ nke abụọ n'ọsọ ahụ anyaala isi na ọ ga-aga ụlọikpe gbagha mkpebi Inec na ntuliaka ahụ.

N'egwuregwu,

Image copyright Matthew Peters

Aka chịburu Manchester United bụ Louis Van Gaal alaala ezumike nka ka ọ dị afọ iri isii na asaa.

Ọ chịkọtara ụfọdụ otu egwu bọọlụ gụnyere Bayern Munich, Ajax, Barcelona na mba Nertherlands.

Akụko BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

N'Afrịka

Ngagharịiwe ndị mba Ọljiria akwụọla ụgwọ makana onyeisiala chịrịla ha afọ iri abụọ bụ Abdelaziz Bouteflika, ekwetala ịhapụ ọchịchị ọ chọburu ịchị nke ugboro ise.

Image copyright Getty Images

N'otu aka ahụ, Bouteflika dị afọ 82 higharịrị ntuliaka ha kwesịrị ime n'ọnwa Epreelụ.

Cheta na ndị mba ya mere ngagharịiwe gafere izu abụọ, ebe ha na-achọ ka ọ rịtuo n'ọkwa ma ghara ịzọ ọchịchị ọzọ dịka ọ chọburu.

Emeka dị ọha Imo mma

Ndị Imo steeti ekwuola na Emeka bụ Ihe dị ọha mma ka ngalaba INEC kpọpụtara aha Chukwuemeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti.

Ụdị ọṅụ juru ndị mmadụ obi ka ya bụ ihe mere bụ ihe ụfọdụ ndị atụwaghị anya, makana ọ bụ okwu a kpụ n'ọnụ ma n'ụzọ ma n'elu soshal midia, ruo ugbua.

O kwere ndị Imo nkwa na n'oge nke ya "ọchịchị obodo ga-anọ n'aka ndị obodo."

Emeka Ihedioha kwuru nke n'ụlọ ya n' Owere n'ụtụtụ Tuzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

N'aka nke ọzọ, Uche Nwosu nwetara ọnọdụ nke abụọ n'ọsọ ahụ anyaala isi na ọ ga-aga ụlọikpe gbagha mkpebi Inec na ntualaka ahụ.

N'akụkọ yiri ya,

INEC agụnyekwuola ntuliaka e mere na Kano n'ime ise ndị ha kwuru na mpụtara ya ezughi ezu igbanwe ntuliaka nke bụ "inconclusive" na bekee.

N'akụkọ si mba ọzọ,

Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba US bụ FAA, agwala ndị ụlọorụ njem ụgbọelu na enweghi ihe ha chere na-egbochi ụgbọelu Boeing 737 Max 8 ife n'elu, n'agbanyeghi na ụdịrị ụgbọelu ahụ akpọkasịala ugboro abụọ n'ime ọnwa isii, ma gbuo mmadụ narị atọ na iri anọ na isii.

Image copyright Getty Images

Ka ọ dị ugbua, mba Sịngapọ akwụsịla ụdịrị ụgbọelu Boeing 737 ahụ ifebata maọbụ ifepụ na mba ha, dịka ụfọdụ ndị ụlọọrụ njem ụgbọelu gụnyere Ethiopian Airlines, Cayman Airways nakwa Comair machiri nke ha.

N'egwuregwu,

Ọ bụ n'aka Zinedine Zidane ka inyeaka ndị Real Madrid ga-esi bịa?

Image copyright Getty Images

Ajụjụ a welitere isi ka Zidane lọghachịtara ịchị Madrid ọzọ n'ime ọnwa iri o ji pụọ, nke bụ na a chụọla Santiago Solari na-achịkọtabu ha, ụkwụ eru ala.

Akụkọ dị mkpa n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Agaghị arụnwu arụrụala na ntuliaka nke ugbua' - Okorie