Building collapse: Ihe isii mere ọtụtụ ụlọ ji ada

Ebe ụlọ elu ogogo anọ dara a daa Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka si n'ụlọakwụkwọ dị na Legọs ka nwereike ịtọ n'ime ụvụrụ ụlọ ahụ

Dịka ụlọ dị na Legos nke Naịjirịa dachara ma gbuo ihe ruru mmadụ 11, nke gụnyere ọtụtụ ụmụakwụkwọ ụmụaka na-aga n'ụlọakwụkwọ dị n'elu elu ụlọ ahụ, anyị na-eleba anya n'ihe na-ebute ụdị mberede ndị a, karịsịa n'ụfọdụ mpaghara Afrịka.

Dịka nyocha ka na-aga n'ihu iji mata ihe butere ụlọ ahụ ịda, ndị injinịa gwara anyị ụfọdụ ihe nwereike ibute nke a.

3. Ntọala na-esighi ike

I hiwe ntọala ziri ezi nwereike ị dị okeọnụ

Ha nwereike ifu ego ole a ga-eji rụọ ụlọ, ọkanmụta n'injinịa na-arụ ụlọ bụ Anthony Ede nke Mahadum Covenant dị n'Ọta, Naịjirịa kwuru nke a n'afọ 2016.

O kwuru na ihe abụọ a ga-eleba anya na ntọala ụlọ bụ ikikere aja siri na arọ ụlọ na ihe dị n'ime ya dị.

Na Legọs, juputara n'ala apịtị kwesiri ka e jiri ntọala siri ike rụọ ụlọ. Nke siri ike karịa ala n'onwe ya.

Mana o kwuru na ndị ọrụ ụlọ na-akpị aka n'ego ekwesiri iji arụ ntọala siri ike nke butere ọtụtụ ụlọ ji ada n'obodo ahụ.

Ọ bụnarị n'ala siri ike, ntọala ụlọ kwesiri i si ike maka ibu o nwereike ibu.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ihe karịrị mmadụ 30 bụ ndị azọpụtara na ndụ dịka ụlọ dachara na Nyagatare dị na Rwanda n'afọ 2013.

2. Akụrụngwa ndị eji arụ ụlọ anaghị esi ike nkeọma

Akụrụngwa na-esighi ike ibuli ibu ndị nọ n'ime ụlọ bụ ihe eji arụ ụlọ oge ụfọdụ, Hermogene Nsengimana si n'African Organisation for Standardisation kwuru n'afọ 2016 na otu ahụ zukọrọ iji mata ihe mere ọtụtụ ụlọ ji ada n'Afrịka.

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ụlọ dara ada gburu ihe ruru mmadụ 33 na Nairobi n'afọ 2016

O kwuru na ụfọdụ ndị ọrụ ngo na-ama ụma were ngwaọrụ adịgboroja rụọ ụlọ iji belata ego.

Ya mere ha na-eji igwe a ga-eji arụ otu ogogo ụlọ elu arụ ogogo ụlọ elu anọ.

O kwuru na ihe a bụ ihe ndị nyocha anaghị etinye anya na ya.

3.Ndị ọrụ na-azọghie ụkwụ

Ndị na-arụ ụlọ na-enwete ngwaọrụ dị mma mana ha amaghị agwakọ ya dịka Maazi Ede si kọọwa.

Nke na-ebute kọnkịrị na-agaghị akwadoli ụlọ ahụ.

Ede bokwara ndị na-enwete orụ ngo ịrụ ụlọ ebubo maka ịkpọta ndị adigboroja ọnụ ego ha pere mpe karịa ndị ọrụ azụrụ nkeọma.

Ọ bụ ụdị agwa dịka ndị Inginịa abụọ bụ Henry Mwanaki Alinaitwe na Stephen Ekolu kọwara butere ụlọ dara na Uganda,

Ụlọ ahụ daranụ nwere ogogo ise ma bụrụkwa ụlọ oriri mgbe ọ dara gbuo mmadụ 11.

Ụlọ daralanụ na Naịjirịa kamgbe afọ 2012

  • Ihe ruru mmadụ narị otu iri itoolu na itoolu n'ụlọ anọ na Naịjirịa site n'afọ 2014 ruo afọ 2016 dịka ụlọọrụ "Nigerian Buliding and road research Institute".
  • 2012: Ụlọ dara ada na Lagọs ruru iri atọ na atọ ebe nke dara n'Abuja dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ụlọ obibi.
  • 2013: Ụlọ iri na asaa dara na Lagos ebe iri abụọ dara n'Abuja.
  • 2014: Ụlọ iri na atọ dara na Lagos ebe abụọ dara n'Abuja.
  • Ihe karịrị ụlọ iri ise na anọ dara ada n'afọ 2017 na Naịjirịa.
  • Ụlọ a dara n'ụbọchị Maachị iri na atọ mere ya nke atọ n'afọ 2019.

4. Ụlọ na-ebu ibu karịrị ya

Maazị Ede kwuru na ụlọ na-ada maọbụrụ na eboro ya nnukwu ibu.

O kwuru na nke a dịka obere nwa eboro nnukwu akpati na-agaghị ebuli ibu ahụ.

Ede kwuru na mgbe ụfọdụ ndị mmadụ rụọ ntọala ga-ebu otu ogo ụlọ, ha were ogo atọ maọbụ anọ tụkwasị ya.

O ji ụlọụka Synagogue nke TB Joshua bụ onye nchịkọta ya maa atụ na-ekwu na ihe mere ụfọdụ akụkụ ụlọụka ahụ ji daa bụ maka na e boro ibu karịrị ya.

Nke a butere ọnwụ mmadụ otu narị.

Image copyright AFP

5. Ndị Inginia kwesiri nwale ma ụlọ ahụ o siri ike.

Ede kwuru na ihe mere ndị inginịa na-enyocha ụlọ imata nke siri ike na nke ga-ada ada ji aghọ aghụghọ bụ maka nrụrụaka.

6.Ndị mmadụ na kachị nt biri n'ụlọ na-achọ ịda ada

Kamgbe ụlọ a dara ọhụrụ na Lagos dachara, akụkọ pụtara n'akụkụ gọọmenti Lagos na-ekwu na adọrọ ndị bi n'ụlọ ahụ aka na ntị n'afọ 2017.

Mana agbanyeghi nke a ndị mmadụ ka na-ebi na ya.

Felicia Agubata bụ inginịa kwuru na ihe mere ndị mmadụ ji leghara iwu mmachi gọọmentị Lagọs nyere gbasara ụlọ a dara ọhụrụ bụ na ha ejighi ndị uweojii bịa dọọ ha aka na ntị.

Ka ụbọchị abụọ gachara ụlọ ahụ ji daa, ụlọọrụ LSBCA ebidola kụriwe ụlọ ndị dara nwalee ikwụsi ike.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: