Rochas Okorocha: Ihedioha enweghị ikike itinye ọnụ n'okwu ego Imo ruo May 29

Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha Image copyright Facebook/Emeka Ihedioha/Rochas Okorocha
Nkenke aha onyonyo Emeka Ihedioha na Rochas Okorocha na-arụ onwe ha aka n'ihu maka okwu akpaego Imo steeti

Onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Emeka Ihedioha, agwaala Gọvanọ Rochas Okorocha ka ọ gbaa mkpata na mmefu steeti ahụ n'anwụ ma ọ bụrụ n'aka ya dị ọcha.

Ihedioha dụrụ ndị ụlọakụ ọdụ ka ha mụrụ anya n'ụdị mmekọ ha na gọọmenti Imo steeti na-emekọ dịka ọchịchị Okorocha na-akụ kwapụ kwapụ.

Okwu ahụ kụsuru Okorocha, onye sara na Ihedioha sị na o nweghị ikike inye ndị ụlọakụ iwu ihe ha ga-eme maka ego steeti ahụ ganye mgbe ọ banyere n'ọchịchị n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, afọ 2019.

Mana Ihedioha gbara isi akwara sị na ya nwere ikike dịka nwafo steeti ahụ ikwu ihe gbasara ọdịmma steeti ahụ.

N'okwu ya site n'ọnụ na-ekwuru ya bụ Chibuike Onyeukwu, Ihedioha kwuru sị "Anyị na-ama ya aka n'ihu dịka ụbọchị na-agwụ, ya wepụta ma gbasaa ozi n'ikuku, ego batara n'akpa Imo steeti na ka e siri mefuo ya."

"Nke a gụnyere "bailout fund" nke biara ugboro atọ, "Paris refund" bụ ego nketa site na gọọmenti etiti n'afọ asatọ; ego okpuru ọchịchị; ego ndị lara ezumike nka na ego ndị ọrụ bekee."

Ọ gọrọ na o nweghị mgbe ya nyere ndị ụlọakụ iwu ọbụla kama na ọ bụ ndụmọdụ ha tinye anya na mmiri n'ihe, n'ihi na dịka o siri kwuo, anya na-acha Okorocha ọkụ dịka o nwere naanị obere oge n'ụlọ gọọmenti.

Okorocha gwara Ihedioha ka o nwee ndidi chere oge ya.

N'okwu nke ya site n'ọnụ onye na-ekwuru ya bụ Samuel Onwuemedo, Okorocha sị, "Ọ gbagwojughị anyị anya na Ihedioha na-enye ụdị iwu a makana dịka onye PDP, anya ya na mbụ na mbụ dị n'akpaego steeti n'atụmatụ 'bute ka e rie'.

"Ya nwee ndịdị chere oge e duru ya iyiọrụ."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a