Gbanweenụ "Electoral Law" na Naịjiria - Ndị ụkọchukwu Katọlik

Ndị ụkọchukwu Katolik Image copyright CBCN

Ndị otu ụkọchukwu ụka Katọlik Naịjirịa enyela gọọmentị ndụmọdụ ka o binye aka "n'Electoral Law" ọhụrụ, na ọ bụ nke a ga-eme ka nsogbu kwụsị ịdapụta na ntuliaka.

Ha wepụtara ya bụ ozi ka ha mechara nzukọ "Lent", ma kpọkuo ndị niile dara ntuliaka na-achọ ịga ụlọikpe ka ha were usoro udo na-azọ ihe ha kpọrọ orubere ha oge niile.

Otu ahụ kpọrọ onwe ha "Catholic Bishops Conference of Nigeria CBCN", gwara ndị niile nwetara mmeri na ntuliaka gara aga, ka ha gbakwasa ụkwụ n'inye ndị mmadụ ihe e ji enyere ndụ aka.

Ha kwuru na oge "lent" bụ mgbe ihe ọhụrụ ji amalite, wee gwa ndị ụka ka ha malite ibu ọnụ, kpee ekpere dị nkwadebe maka mbilite n'ọnwụ nke Kraịst.

Ozi ahụ bụ nke a gụpụtara n'ụka Katọliki niile na Naịjiria n'ụbọchị Maachị 17, 2019, iji mee mmemme ụka nke abụọ na Lent.

Ha kelere Bishop Ignatius Kaigama nọbu na Jos ma bụrụzịa onye ezigara Abuja dayọsis.