Onnoghen: Aka enwe banyere n'akwụkwọ mkpọpụta akụnaụba m

Onnoghen

Ọkaikpe ukwu Walter Onnoghen tụrụ 'down' ka arụsị n'ụlọikpe ebe a na-enyocha ya maka ịgbanarị ịkpọpụta akụnaụba o nwere.

Ka ọ pụtara n'ụlọikpe "Code of Conduct Tribunal (CCT)", o kwuru na ebubo e boro ya maka mmerụaka gbasara mkpọpụta akụnaụba ya esighị n'aka, na aka enwe banyere n'ofe.

O kwuru nke a site n'ọnụ ọkaiwu na-anọchite ya bụ Adeboyega Awomolo SAN, onye kwuru na akwụkwọ mkpọpụta ahụ pụtara n'afọ 2014 na 2016 adịghị etu o kwesịrị ịdị.

Dịka ndị Channels TV si kwuo, e higharịrị mgbe ọzọ Onnoghen ga-apụta n'ụlọikpe, buga ya n'ụbọchị 21 nke Maachị 2019, makana ha chọrọ ka onye na-elekọta akpaego Onnoghen gbaa n'ụlọikpe.

Nke a bụ mbụ ọ na-apụta n'ụlọikpe kemgbe ọnwa Jenụwarị a kwụsịri ya ọrụ n'ike ma gbaa ya akwụkwọ.

Ngagharịiwe na "Trade Fair"

Ndigbo na-azụ ahịa na 'Trade Fair' Legọs emeela ngagharịiwe ma tie mkpu maka kepukepu na a chọrọ ịnaghara ha ọdọahịa ha nye nna ukwu ọzọ.

N'okwu ya, onye nchikọta ndị ahịa ahụ bụ Tony Obih, kwuru na ha nụrụ na gọọmenti etiti chọrọ iwere ahịa ahụ nke ha gbazinyere ha nyefee n'aka ndị gọọmenti Legọs steeti.

N'ofesi,

Mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ itoolu merụrụ ahụ ka otu nwoke kwara mgbọ n'otu ụgbọoloko n'obodo Utretch dị na mba Netherlands.

Image copyright @POLITIEUTRECHT / TWITTER
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii Utretcha wepụtara foto a bụ nke Gokmen Tanis, onye ha na-enyo kpara mkpamkpa a

Ebe onyeisiala mba Mozambique bụ Filipe Nyusi, na-ekwu na ihe ruru mmadụ puku anwụọla kemgbe ajọ ifufe Idai wakporo mba ya.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ajọ ifufe Idai a si Mozambique mafere Zimbabwe ebe o gbukwara ọtụtụ mmadụ

N'egwuregwu,

Ngalaba UEFA eriala Cristiano Ronaldo iwu maka etu o si ṅụrịa ka o nyere goolu nke atọ ya ụbọchị ha dọriri ma chụpụ Atletico Madrid n'asọmpi Champions League.

Image copyright Getty Images

Nwoke ọzọ awụọla ndị mmadụ mgbọ na mba Netherland

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo The uweojii jupụtara ebe ahụ ihe mere

Ndị uweojii kwuru na otu nwoke gbasasịrị egbe n'ọdọ ụgbọoloko dị na obodo Utretch, gbuo otu onye ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ n'ụtụtụ Monde.

O nwebeghị onye ha nwụchiri dịka a ka ji ụgbọelu atọ achọ nwoke ahụ kpara mkpamkpa ahụ.

Ndị uweojii kwuru na ha na-enyo ihe mere dịka "aka ọrụ ndị omekataraihepụụjọ."

N'ihe mere ndị obodo Utrecht kwụsịrị njem ụgbọoloko ganye n'udo alọghachị.

'Akwụ m chịm na PDP' - Jonathan

Image copyright Getty Images

Aka chịburu Naịjirịa dịka onyeisiala bụ Goodluck Jonathan azarala ọnụ ya n'akụkọ na-efegharị na ya agbajọọla ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ otu PDP mere ya ihe ọ bụ taa.

Nke a na-abịa dịka a na-anụ kepu kepu na onye lekọtara achụmnta vootu Atiku Abubakar bụ Gbenga Daniels na-ekwu na ndị nkwado na-arịọ ya duru ha baa na pati APC.

Ọkaikpe Onnoghen ga-awụchi n'ụlọikpe taa

Image copyright @Crevo360_Ng
Nkenke aha onyonyo Justice Walter Onnoghen

Ogbakọ otu ndọrọndọrọ CUPP akatọọla ihe ha kpọrọ mmaja ezighi ezi a na-eme onye bụbu ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Walter Onnoghen.

Ha kwuru na ha nwere ihe akaebe ịgosi na ndị EFCC nakwa ndị uweojii gara n'ugbo Onnoghen ịmaja ndị na-arụrụ ya ọrụ iji mee ka o tinye akwụkwọ arụkwaghị m.

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images

Praịm Mịnịsta mba New Zealand bụ Jacinda Ardern ekwuola na gọọmentị ya kwụdosiriike na mgbanwe achọrọ ịme iwu banyere ịbu egbe na mba ahụ.

O kwuru nke a dịka akpụpụrụ Brenton Tarrant ụlọikpe ịzara ọnụ ya maka mmadụ iri ise ọ gbagburu n'ụlọekpere ndị alakụba.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Aka na-achịkọta otu super Eagles nke Naịjiria bụ Gernot Rohr ejirila Ndifreke Effiong dochie Ola Aina dịka ha na-akwado ịchọpụta onye tozuru asọmpị iko mba Afríka.

Gee akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile