Aba: Di na nwunye gachara agbamakwụkwọ kubie - Uweojii

Di na nwunye Image copyright Getty Images

Ọ dịkwazi ka chi na-efo n'ụwa, ọ na-efote ihe iribama dị icheiche.

Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, kedụ ihe aga-akpọ akụkọ di na nwunye gara bụrụ onyeisioche agbamakwụkwọ, buru nri enyere ha lawa ma rie ya ka ha narụrụ mana ha si n'ụra fere ọnwụ dịka ndị uweojii si gwa BBC.

Ọ nụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na n'ụtụtụ ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Maachi, ka ndị be di na nwunye ahụ biara mee mkpesa.

Ha si na kamgbe ha na-akpọ ekwenti di na nwunye ahụ, na onweghị onye na-aza.

Ha wee si ka ha gaa n'ụlọ ha.

O kwuru na ha kụgidere aka mana onweghị onye zara ha, ha wee were mbube riwa ulọ ha site na gbamgbam ụlọ ahụ.

Geoffrey kwuru na ha gwara ya na ndị otu ya na mgbe ha ribara, na ha hụrụ ozu ha abụọ na nwannne nke nwaanyi ka ha tọgbọrọ n'ala.

Nke a mere ka ha bia mee nkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii ma kpọrọkwa nwanne nke nwaanyị so ha gawa ụlọọgwụ n'ihi na ọ ka na-eku ume.

Ogbonna kwuru na ya na ndị otu ya ka na-eche ka nwata nwaanyị ahụ nwetecha onwe ya ka o were gwa ha ihe ọ ma maka ya bụ ihe mberede.

O kwukwara na ha na-elekwa anya nyocha ga-esi n'aka dọkịta pụta gbasara ihe gburu di na nwunye ahụ, mana ugbua ahụ ha abanyela ụlọozu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara