Minimum Wage: Kedụ steeti ga-amalite ikwu ya?

Ndịọrụ na-eme ngagharịiwe Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndịọrụ Nigeria na-esi ọnwụ na ụgwọ opekatampe ga-abụlrịrị N30,000

Ọ bu eziokwu na ọtụtụ ndị ọrụ na-amali elu maka mkpebi Sineti nyere gbasara ụgwọ opekatampe

Ha kwekọrịtara na ọ bụ puku naira iri atọ mana ajụjụ ndị ozọ na-ajụ bụ kedụ steeti ga-ebuzo malite ya bụ atụmaatụ?

Etu ọdị ugbua, kọmishọna mgbasa ozi n'Anambra steeti bụ Don Adinuba kwuru na kamgbe ka steeti ahụ kpebiri na ha ga-akwụ ya bụ ụgwọ ọhụrụ

Adinuba a gwaghị BBC Igbo mgbe ha ga-amalite mana o kwuru na steeti ahụ nwereike ịbụ nke mbụ ga-akwụ ya bụ ụgwọ.

Gọọmenti Imo steeti site n'ọnụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi soshal midia Rochas Okorocha kwuru na ha enwebeghị ihe ha nwere ikwu maka mgbe ha ga-amalite kwụwa ụgwọ a.

Etu a ka ọ dịkwa n'akụkụ gọọmenti nke Abia steeti.

Kọmishọna mgbasa ozi n'Ebonyi steeti ebughị ekwenti ya mgbe BBC Igbo kpọrọ ka ha mata ebe ha kwụ na mmalite ya bụ atụmaatụ.

Gọọmenti Enugu steeti site ọnụ kọmishọna mgbasa ozi ya kwuru na ha di njikere ikwụ ụgwọ ọnwa ọhụrụ a ma onyeisiala binyecha aka n'akwụkwọ gbasara mkpebi sineti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: