Father Clement Ugwu: Onye ọbụla gburu ya bụ onye abụrụ ọnụ - Ụmụnwaanyi

Ụmụnwaanyị/Fada Clement
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị tọgbọrọ n'ihu ụlọụka na-eru uju

Ụmụnwaanyị ụlọụka St Marks Katọlik dị n'Obunofia Ndịụnọ jị nnukwu iru uju na ịkwa akwa na ekwuputa na obi agbawaala ha na ogbugbu ndị ntọrị gburu fada parish ha bụ Clement Ugwu.

BBC rutere na ya bụ Parish wee hụ ụmụ nwaanyị juputara ebe ahụ na ebe akwa.

Ha kọwara na Fada Clement ahụ egburu bụ nwoke nwere obi ọma ma na atụ egwu Chineke.

Josephine Ozommadu, mabel Ude na ụmụ nwaanyị ndị parish ahụ tọgbọrọ n'ihu grotto Virgin Maria ebe ha nọ na ekpe ekpere maka ezumike mkpụrụ obi fada Clement.

Ọtụtụ ụmụ nwoke ndị Parish council, ndị Nna na ụmụ okorobịa gbakọrọ ebe ahụ ekweghị agwa anyị okwu n'ihe onyonyo makana iwe na ọnụm Juru ha obi.

Image copyright Chioma Obianinwa
Nkenke aha onyonyo Ndị ntọ tọrọ Fada Clement Ugwu na be ya.

Ya bụ ụlọ Fada ebe ndị omekaome bịara tọrọ ya dị n'akụkụ ụlọ uka St marks parish Obunofịa ndị ụlọ.

Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na 'ATM' Fada Clement ma gbuo ya - Bishop Onaga

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCatholic Church: 'Ndị ntọ wekọrọ ego niile dị na ATM Fada clement, gbuo ya' - Bishop Onaga

Ụzụ akwa na iru uju na-ada ugbua n'Enugwu katọlik diocese n'ihi na ụkọchukwu Fr. Clement Ugwu bụ onye ndị ntọrị tọrọ ka mgbe otu izu ụka abụrụla onye nwụrụ anwụ.Bishop Callistus Onaga ji nnukwu iru uju were kaa ụka ozu ikpeazu tata tupu adọnye ozu Clement Ugwu n'ala n'ogige ebe a na-eli ndị Fada na Holyghost Cathedral Enugwu.

Bishop Onaga kọwara na ya bụ njinji jiri n'ụlọ Fr. Clement na Obinifia Ndịuno ebe ndị omekaome bịara gbaa ya egbe wee tọrọ ya, ha bukwaziri ụgbọ ala ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Onaga kwara arịrị na ka mgbe otu Izu ụka ahụ, na ha na ayọ ndị uwe ojii ka ha chọpụta ebe fada nọ, ma kwaa arịrị na ndị ohi ahụ jị ATM cadi fada na adọrọ ego ya.

Ọ gwara BBC na ọ bụ n'ụtụtụ a ka a hụrụ ozu ya rerichara ereri n'ime ọhịa were kwuo na ka ozu di gosiri na ọnwụọla kemgbe ụbọchị ahụ ha gbara ya egbe.

Ndị ntọ ahụ were gaa n'ihu na asị ndị ụka na umu nne fada Clement nye ha ego tupu ahapụ ya.

Otu ezigbo enyi ya nwoke bụ Steven Okwudiri kwuru na ọ bụ ndị na-aga ugbo ziri ozi na onwere ozu dọrọ n'ọhịa mgbe ha ruru ebe ahụ ọbụrụzịa ozu Fada Clement.

Ndị ụkọchukwu ibe ya Fr. Benjamin Achi na Pascal Ekediegwu kwuru na obi adịghị ha mma makana ndị ụkọchukwụ dịzị ndị ntọrị ka nwa atụrụ eji chụọ aja nke na ha na-atọkarịzị ha.

Ha nyere ndị gburu Fada Clement Ugwu ndụmọdụ ka ha chegharịa na njọ ha tupu ha anwụọ n'ime ya.

Ụkọchukwu kwuru okwu chukwu na ụka ozu ahụ bụ Fr Theo Ndulue kwuru na nke a bụ ụkọchukwu nke atọ a na-eli n'Enugwu katoliki diocese na 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a