Market Match: Ụmụ nwoke unu adọzịna anyị aka n'ahịa - Ụmụnwaanyị

Ngagharị iwe n'Enugwu
Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị na-eme ngagharị iwe

Ụmụ nwaanyị karịrị otu nari eguzobela ngagharị iwe n'Ogbete main market Enugwu iji megide ịkwa emu na ịdọ aka nke ụmụ nwoke na-eme ha ma ha bata n'ahịa.

Onye chikọbara ya bụ ngagharị iwe bụ nwaada Juliet Keego kwuru na ihe ha jiri chikọba ya bụ ngagharị na gburu gburu Enugwu bụ ka odo ụmụ nwoke anya na nwaanyị nwe onwe ya, nke mere na Onye ọbụla enweghị ikike ịdọ ya n'aka.

Keego kwuru na ọ bụ n'Ogbete main market nakwa Holyghost park ka ya bụ akparamagwa na-apụ anwụrụ nke na ndị na azụ ahịa ma ọ bụ ndị Kọndọktọ na adọkpụ ụmụ nwaanyị n'aka kwa mgbe kwa mgbe.Nwada Chinaza Anyalebechi Kwuru na ọ na abụ nwaanyị bata ahịa, ụmụ nwoke a na adọ ya n'aka na-akpọ ya "oyiri m" "my size" "my colour "nke nwaanyị" " Chichi" ma jikwara ịkpụ mkpụrụ ọhịa akpọ nwaanyị.

Nkenke aha onyonyo Juliet Kaego onye nchịnkọta ngagharị iwe a

Iji gosi ka ya bụ mmiri siri baa n'opi ụgbọgịrị, ụmụ nwoke na-azụ ahịa n'Ogbete Main market gwara ndị na eme ngagharị ahụ na ha ga-akachirịrị ntị na adọkpụ ụmụ nwaanyị ka ha bịa gota ha ihe ha na ere.Ndị nchịkọta ahịa Ogbete bụ OMTA kwere nkwa ịdọ ndị otu ha aka n'ntị ka ya bụ agwa ọjọọ kwusi.

Nkenke aha onyonyo Ụmụnwaanyị na-eme ngagharị iwe

Akụkọ ga-amasị gi

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChristchurch: Buo agha megide iyi ndụ egwu n'ụwa niile- Jacinda Arden

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a