Enugu state: Anyị amaghị ma ndị ọchụehị egburu onye nkuzi mahadum - Uweojii

Nnamdi Oguche

Ọnụ na ekwuchitere ndị Uwe ojii n'Enugwu bụ Dsp Ebere Amarizu adọọla ndị na-ede ihe na social media aka na ntị

O kwuru ka ha ghara ịdị na ekwu na ọ bụ ndị Ọchụ ehi Fulani gburu onye nkuzi mahadum Nnamdi Oguche.

Amarizu depụtara ozi kọmishịọna Enugwu bụ Suleiman Balarabe ziri were kwuo na ha atinyela anya na mmiri ịchọpụta ndị gburu ya bụ nwa amadị.

Ihe butere akụkọ ndị a bụ na ụbọchị wednezde mazi Nnamdi Oguche bụkwazị ode akwụkwọ n'okpuruọchịchị Ụzọ uwani n'Enugwu gara ikpe ala dị na etiti ha na ndị Ezeagụ nakwa ndị Fulani Ọchụehi.

Ka mazi Oguche na-ala, ndị ekwuru na ha bụ ndị Fulani kwụsịrị ụgbọala ya ma gbagbunyụọ ya anya.

Nkwa dagharịa azọgharịa ọkpa egwu

Ọ bụ ya na-eme ugbua n'Osun steeti dịka otu ụlọikpe pụrụiche na steeti ahụ kpọpụtara aha Ademola Adleke dịka onye meriri ntuliaka e mere n'ọnwa september afọ 2018

Cheta na ọ bụ aha Gboyega Oyetola ka Inec kpọpụtara meriri ya bụ ntuliaka.

N'otu aka ahụ,

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP bụ Atiku Abubakar ezigarala Ademola Adeleke ụkpa ekele maka akụko a.

Oji ohere ahụ kwuo n'ụlọikpe bụ olileanya nke ikpeazụ n'ebe nchekwa ọchịchị onye kwuo uche ya nọ.

Image copyright TV3 Ghana

Ihe mberede okporoụzọ egbuola mmadụ iri isii n'obodo Bono dị na mba Ghana.

Ndị uweojii kwuru na ụgbọala abụọ ahụ kụkọtara isi ọnụ nke mere na ọtụtụ ndị niile nọ na ya bụ ụgbọala nwụchasiri.

Ha kwuru na ihe a mere elekere abụọ nke ọnụ ụtụtụ n'Anọma Nkwanta dị n'ime ọwụwa anyanwụ Kintampo.

Onyeisi ndị uweojii na Kintampo bụ ACP Joseph Antwi Gyawu gwara ndị ntaakụkọ na ha amalitela inyocha etu ụgbọala abụọ ahụ si kụkọta isi ọnụ.

O kwuru na ụgbọala nke nwere akara GT 5694 18 nakwa nke bu akara GT 3916 17 bu mmadụ ruru iri ise tupu ihe mberede n'ime ha.

Etu ọ dị ugbua, eburula ndị dị ndụ merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ ka ha nata ọgwụgwọ.

Akụkọ ọzọ pụtara n'ihe a na-ekwu na mgbe ha abụọ kụkọtara isi , otu n'ime ha nwuru ọkụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ nwụọ.

Ndị uweojii na ndị na-emenyu ọkụ nọ ebe ahụ na-enyeaka ịchịkọpụta ngwongwo ndị mmadụ fọrọ ebe ahụ iji wee chọpụta nke bụ nke.

Nigeria vs Seychelles

Naịjirịa ji ọkpụ goolu atọ asatara otu merie mba Seychelles mgbe ha zụkọtara onwe ha n'Asaba na mgbede.

Gụọ ya n'uju ebe a Super Eagles abọriela Seychelles ka ọkụkọ

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara