Sexual Assault: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ gbara nwaanyị ọtọ

Nwaanyị na-ebe akwa Image copyright Getty Images

Ndị uweojii nwụchiri mmadụ atọ ahụ maka ha gbara nwaanyị ahụ ọtọ ma mebọọ ya n'ime ihe onyonyo na-efegharị.

Akụko kwuru na nwaanyị ihe mere bụ Ogochukwu Okafor na Ifeanyi Azotani bụ enyi n'igwe soshal midia bụ Facebook.

Ọ bụ Ifeanyi ratara nwaanyị ahụ na be ya tupu nwunye ya na enyi nwunye a gbaa ya ọtọ seta ya n'ihe onyonyo.

Akụko kwukwara na ha gwara nwaanyị ahụ bụ Ogochukwa ya kwụọ puku naira iri isii maọbụ ha ekesaa ya bụ ihe onyonyo.

Mgbe Ogochukwu jụrụ ịkwenye n'iji egwu anapụ mmadụ ihe bụ ihe ha chọrọ ịme ya, ha gara n'ihu kesaa ihe ha setere.

Ndị uweojii ekwuola na ha ga-akpụpụ mmadụ atọ ahụ ụlọikpe maka ihe a ha mere.