Nigeria vs Egypt: Nigeria amịala Egypt ka ịsam

Image copyright @Omeruo

Otu Super Eagles nke Naịjirịa ejirila otu ọkpụ goolu gbaka neetị ndị mba Igipt mgbe ha zutere na mgbede Tuusde.

Ọ bụ Paul Onuachu nyere goolu zọpụtara isi Naịjirịa na-agba nke mbụ n'asọmpị ahụ.

Ndị mmadụ tụrụ anya na onye ọgbaa bọọlụ a ma ama bụ Mohammed Sala ga-apụta n'asọmpị ahụ mana ọ bịaghị.

Trump na mgbidi ya.

Donald Trump Image copyright AFP/Getty Images
Nkenke aha onyonyo Trump Sịzị sị mewe ngwangwa bia gbaa ya ajụjụ ọnụ maka ebubo a na-ebo ya

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enwetala otu ijeri dọla n'aka ngalaba nchekwa Pentagon dị na mba Amerịka.

Ego a bụ nke ọ chọrọ iji rụọ mgbidi ga-ekewa mba Amerịka nakwa mba Mexico.

Ọ bụkwa ego nke mbụ n'okpuru gbata gbata mba ahụ nke Trump kwupụtara mgbe ọ gbachichara ndị ụlọomeiwu Amerịka nkịtị n'ikweta inye ego eji arụ ya bụ mgbidi o kwere na nkwa mgbe ọ na-azọ ọchịchị.

Gịnị butere nke a?

Trump ekwuola na ihe na-eme n'akụkụ mgbidi ahụ akarịala ihe anya na-ahụ, nke mere na ọ bụ nanị mgbidi ga-akwụsị ndị omekome ịbata mba Amerịka.

Image copyright Getty Images

O nwere ndị iwe na-ewe maka ego a?

Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Democrat agbarụọla ihu na-ekwu na anataghị ha ohere wee wepụta ya bụ otu ijeri dọla.

Cheta na ndị ụlọomeiwu jụrụ ịnye ya ya bụ ego na mbụ nke mere na agbachiri gọọmentị Amerịka ihe karịrị otu izuụka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a