Breast Ironing: Ị nụtụla maka omenala ịpịatu ara nwaanyị?

Ịpịatu ara nwaanyị Image copyright Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ na mba Briten chọrọ ịmalite nkuzi maka omenala a n'ụlọakwụkwọ ha.

Ha kwuru na ọ dị mkpa ịme nke a iji chekwa ụmụaka ụmụnwaanyị na mmegbu na mkpagbu so ya bụ ihe.

Otu onye omeiwu na Briten bụ Nicky Morgan kwuru na "ndị nkuzi nwere ọnọdụ dị mkpa n'ịgbasa ozi gbasara ya bụ okwu.

Ngalaba ọzọ chịkọtara ihe na-eme na mba ahụ kwuru na "ọ bụ ọrụ ndị nkuzi ịkwuputa okwu maka omenala ahụ"

Gịnị bụ ịpịatu ara nwaanyị?

Image copyright Getty Images

Omenala a pụtara ịpịatu ara ụmụaka ndị nwaanyị ara ha ka na-eto ọhụrụ.

A na-eji okwute dị ọkụ maọbụ mma dị ọkụ e dee ara nwata nwaanyị iji kwụsị ya otito maọbụ mee ka ọ daa ada.

Oge ụfọdụ a na-eke akwa n'obi nwata nwaanyị ahụ iji pịatu ara ahụ nke na-eru ọnwa ole na ole.

"Ịkwesighi ịbe akwa"

Image copyright Getty Images

Ndị gwara BBC maka ahụmihe kọwara na ịkwesighi ịbe akwa ma a na-eme gị ihe a.

"I bee akwa, i wetala ezinaụlọ gị mkparị na mmebọ" ka Kinaya* gwara BBC.

Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ nne ha maọbu nne nne ha na-eme ha ihe ahụ

Na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka ebe omenala a siri malite, ha kwenyere na ihe a ga-eme ka anya nwoke pụọ n'ahụ ụmụaka ndị nwaanyị.

Kinaya* abụghị ezigbo aha nwaanyị ahụ, BBC gbanwere ya iji chekwa ya.

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a