Children: Nwa nwaanyị dị afọ ise a tọọrọ na Warri apụtala na Kaduna

Aisha Ibrahim na nwaanyị onye uweojii Image copyright @PoliceNG
Nkenke aha onyonyo Aisha Ibrahim na onye uweojii makọrọ onwe ha dịka azọpụtachara ya n'aka ndị ntọrị

Nwa nwaanyị gbara afọ ise bụ Aisha Ibrahim bụ onye ndị ntọ tọọrọ na Warri apụtala ihe na Lafia.

Ndị ntọrị tọọrọ Aisha Ibrahim n'Ibudu 1 dị na Warri Delta Steeti n'abalị iri na isii ọnwa Maachị.

Ebe ndị uweojii zọpụtara ya n'aka ndị ntọrị a na Bukan-Kwatu dị na Lafia, Kaduna Steeti na enweghị ọkọ ọbụla kọrọ ya.

Ha nyefere Aisha n'aka nna ya bụ Ibrahim Abdulmalik n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Abuja n'abalị iri abụọ nke ọnwa Maachị.

Abdulmalik kelere Chineke ma tokwa ndị uweojii n'ọrụ ọma ha rụrụ isochi okwu ntọọrọ nwa ya azụ n'egbughi oge ọbụla.

#Market Match: Onye akpala nwaanyị aka n'ahịa

Ndị uweojii sị na ndị ha nwuchiri gụnyere Abdullahi Abubakar dị afọ iri atọ na nne ya bụ Jummai Salihu dị afọ iri isii na abụọ bụ ndị si na n'obodo Bukan-Kwatu dị na Lafia Kaduna Steeti.

Ọ bụ Abdullahi tọọrọ nwata ahụ si Warri, Delta Steeti gawa Lafia, Kaduna Steeti, ma kpọgara nne ya bụ onye zoro nwata ahụ.

Abdullahi kpọrọ nne na nna Aisha n'ekwentị ka ha kwụọ ụgwọ n'isi nwa ha bụ Aisha tupu aka ndị uweojii akpara ha.

Ndị uweojii ka na-achọ onye a kpọrọ Inusah Ibrahim dị afọ iri ise na asatọ bi na Warri bụ onye so ha kpaa nkata.

Mana onyeisi ndị uweojii bụ M.A Adamu adọọla nne na nna aka na ntị ka kpachara n'ebe ụmụ ha nọ n'ihi akụkọ ntọ, mwakpo na ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a